You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Christmas Message: Ị na-arụ ọrụ ndị a? Chefuo maka 'ezumike'
Ị nọ n'ụlọ gị ugbua enweta ezumike? Mara na enwere ndị ọrụ ha ekweghị ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.
Na ndị mmadụ na-ala ụlọ ekeresimesi maọbụ na ha nọ n'ụlọ maka ezumike a kpọrọ "public holiday" abụghị maka ọtụtụ n'ime ndị na-arụ ọrụ ndị a.
Ya mere, ka ị na-ekpori ndụ gị na-enwe aṅụrị, cheta na enwere ndị nọ ebe ha nọ na-eme ka ụbọchị na-aga were were na ndụ ndị mmadụ.
Otiegwu a ma ama bụ Olamide chetakwara ha.
Ebe o si "ka njọ" bụ na ọrụ ha enweghị nkwụsị, ọ bụ ọrụ a na-arụ ụbọchị asaa n'ime otu izu.
Ị nwere ike ịlelị ha anya, mana ị ma ụdịrị uru ha bara ọkachasị n'oge ezumike a?
BBC chọrọ ịkọwapụta ụfọdụ n'ime ha:
1) Ndị ọkwọụgbọala/ọgbatumtum:
Kedụ ụzọ ọzọ ị ga-esi gazuo ebe niile na-agụ gị ịga maọbụrụ na ị nweghị ụgbọala?
Ọ bụ ndị ọkwọụgbọala maọbụ ọgbatumtum ga-ebuga gị ebe niile ị chọrọ ịga.
Ọ bụrụzịkwanụ na ha chịba ụkwụ n'ụlọ sị na ha nọkwa n'ezumike dịka ị si nọrọ, ị mara na ị ga-abụzị oji ụkwụ aga Aba.
2) Ndị ọrụ nchekwa:
Ndị uweojii, ndị agha na ndị ọzọ ọrụ ha bụ ichekwa obodo kwara akpa ha lawa n'ụlọ kwuo na ha na-emechi ọrụ maka ezumike, kedụ onye ga-elekọta obodo?
Ndị ọrụ nchekwa anaghị emechi makana oge niile, anya kwesịrị iru ha ala n'ihe na-aga ebe niile, ka ọgbaghara ghara ịdapụta.
Ọrụ ha gụnyekwara ịhụ na ị labara n'udo, ma hụ na anya gị abụọ mechiri ọfụma ka ị na-arahụ ụra.
3) Ndị ntaakụkọ:
Ọ bụrụ na ndị ntaakụkọ ghara ịrụ ọrụ, kedụ etu ị ga-esi mara ma a sị "ngwanụ gbafuonu"?
Ọrụ ndị ntaakụkọ dị ezigbo mkpa makana etu ahụ ka ị ga-esi mara ihe na-eme n'akụkụ gị nakwa na mbaụwa.
Ebe o si kara ndị na-arụ ya mma bụ na e nwere ike irụbiri ya arụbiri, nke bụ na ị rụtụ obere, onye ọzọ arụtụkwa obere, mana akụkọ ga-agarịrị n'ihu.
Ma ndị na-arụ na redio, ihe onyonyo, ndị na-ede ede, ndị na-agụ agụ, onye ọbụla na-apụta n'ọgbọ n'agbanyeghị ụbọchị ọ bụ.
4) Ndị na-arụ n'ụlọọgwụ:
E kwesịrị ichetara gị uru ndị dọkịta na nọọsụ bara na ndụ mmadụ?
Ọrụ ha anaghị ama mgbe bụ ụtụtụ, abalị, maọbụ ụbọchị ezumike, n'ihi na ha ga-anọ ya ma mmadụ anọ n'ogige ha maọbụ anọghị, makana anaghị amacha mgbe ihe ga-ebute mmadụ.
5) Ndị na-arụ n'ọdọụgbọelu:
A ga-asị ndị mmadụ emela njem ụgbọelu n'ihi na "ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ezumike"?
Ị mee elu mee ala, ndị mmadụ ga-emerịrị njem, mana kedụ onye ọ bụ ọrụ ya ịhụ na ị mere njem ụbọchị kwesịrị ịbụ nke ezumike?
Ọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ọdọụgbọelu; dịka ndị ọkwọụgbọelu, ndị na-elekọta ndị mmadụ n'ime ya nke Bekee kpọrọ "air host/hostess", ndị injinia ọrụ ha bụ ilekọta ụgbọelu tupu o felie nakwa ndị ọzọ ọrụ ha bụ
ịhụ na njem gị n'ụgbọelu ga-aga ọfụma.
6) Ndị na-ere nri:
Eeh! N'ezie ọ na-akara ọtụtụ ndị mma isi nri ha ga-eri n'ụlọ ha, mana kedụ maka ndị na-enweghị ohere ahụ?
Kedụkwanụ maka ndị na-apụ ọrirị ebe a na-ere nri dịka ụlọ oriri na nkwari na nke Bekee kpọrọ "fast food joint"?
"Nri bụ ndụ", ndị na-ere nri ma nke a, ya mere ha ji azọ ndị mmadụ ndụ site n'ire nri ma n'ụbọchị ezumike o, ma n'ụbọchị nkịtị.
7) Ndị ọrụ gbatagbata:
Ndị ọrụ ha bụ imenyụ ọkụ ọgbụgba, ndị ọrụ ha bụ ịzọpụta ndị mmadụ n'ihe mberede nakwa ndị ọzọ na-arụ ụdịrị ọrụ ndị a, anaghị achịba ụkwụ n'ụlọ.
Ha na-aga ọrụ makana ụdịrị ọdachi a nwere ike ịdapụta.
8) Ndị nchekwa ụlọmkpọrọ:
Ha laa ezumike, onye ga-echekwa ndị nọ n'ụlọmkpọrọ?
Ọrụ ha bụ ịhụ na ndị a tụrụ nga agbafughi ga kpaa mkpamkpa, ya mere ha ga-anọ ya site n'ụtụtụ ruo n'abalị, ịhụ na ihe ndapụta adapụtaghị.
Ka mmadụ ghara ikwu "aka m adịghị n'ihe mere".
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: