You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chiwetalụ Agu: 'Ndị anyaụfụ chọrọ iwepụ ndụ m ma Chineke ekweghị'
Chiwetalụ Agụ, onye e ji ime ihe ejije mara akọwaala etu ndị anya ụfụ ji chọọ iwepu ndụ ya mana Chineke zọpụtara ya.
O kọrọ nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ụbọchị Fraide n'ihe omume a kpọrọ Gịnị na-afịọ.
Na mkparịtaụka a bụ nke e gosiri na Facebook, ọtụtụ ndị nkwado Chiwetalụ jụrụ ya maka akụkọ gbasara ọrịa a sị na ọ rịara n'ọdị nso a.
O wee kọwaa na ọ bụ ndị na-atajiri ya anya chọrọ igbu ya.
Dịka o si kwuo: "Mụnwa bụ onye kachasị mee ihe ejije onyonyoo na Nollywood. Ejije m megoro eruola 985."
"Onye na-esote m emerubeghi 200."
"Ihe nrite (awards) enyerela m akarịala 70, onye na-esote m arubeghi 20".
"Nke a kpatara ụfọdụ ndị na-emekwa ihe onyonyoo ji chọwa ịkpa nkata ka ha gbuo m, maka na ha sị na m na-anapụ ha nri n'ọnụ."
Chiwetalu Agu kwuru na oge e buru ya gaa ebe dị icheiche ịgwọ ya, ọtụtụ ọgwụ ka e weputara n'ahụ ya bụ nke a kụrụ ya.
Mana ọgwụ ndị ahụ egbughị ya n'ihi na o ji Chineke hibe isi.
Ugbua, o kwuru na ya adịchaala mma.
Etu o si malite ime ejije
Chiwetalu Agu kwuru na ọ bụ na ụlọọrụ 'Nigeria Television Authority' dị n'Enugwu ka ọ malitere ime ejije n'afọ 1981.
N'oge ahụ, ọbụghị onye ọrụ NTA, kama ọ na-abịarute abịarute bụ nke bekee kpọrọ 'guest artiste'.
Ego a na-akwụ ya n'oge ahụ bụ naanị naịra ise.
O wee mechaa gbagote na Legọs n'isi ụlọọrụ NTA sonyekwara ha.
O kwuru na ọ bụ ya họtara ndị so mee ihe ejije mbụ e ji malite Nollywood bụ 'Living in Bondage'.
E mechaa, ha mee 'Taboo', 'Circle of doom' na ndị ọzọ.
Ezinụlọ ya
Dịka o si kọọrọ BBC Igbo, Chiwetalu Agụ lụrụ otu nwaanyị.
Aha nwunye ya bụ Nkechi Juliana Agu, onye Mbaise n'Imo steeti.
Ha mụrụ ụmụ ise, gụnyere ụmụnwoke atọ na ejima ụmụnwaanyị abụọ.
Maka Biafra
Chiwetalu kwuru na ọ bụ ndị Igbo bu ụzọ chọwa ka Naịjirịa dịrị n'otu mana mmegbu a na-emegbu ndị Igbo mere ha ji chọwa ị nọrọ onwe ha.
O kwukwara na ọ bụrụ na ọchịchị Naịjirịa dị mma etu o kwesịrị, onweghị onye ga-ekwute okwu nkewa.
Mana ọ dọrọ Mazi Nnamdi Kanu aka na ntị ka o were amamihe wee chọwa maka ihe gbasara Biafra.
Ọ gara n'ihu kwuo ka Kanu gee ndị okenye Igbo ntị ka e wee chọọ ụzọ a ga-esi kwuo okwu gbasara Biafra na-emeghị ọgbaaghara.