Charity Maduka: Ihe gbara ọkpụrụkpụ na ndụ nwunye Cosmas Maduka

Charity Maduka, nwunye Cosmas Maduka, onye e ji Coscharis mara, alaala mmụọ.

Akụkọ kwuru na oriaku Charity Maduka nwụrụ n'ụbọchị Sọnde a dịka ọ rịachara obere ọrịa.

Otu onye ezinụlọ ya na-achọghị ka anyị kpọọ aha ya ugbua kwuru na ọ bụ eziokwu na nne ha ahapụla ụwa a.

Onye bụ Charity Maduka?

Ọtụtụ ihe a ma banyere Charity Maduka bụ ihe di ya bụ Cosmas kwurula banyere ya.

Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'oge gara aga, Cosmas Maduka kwuru na ọ bụ nwunye ya mere ya ihe ọ bụ taa.

Coscharis kwuru na ya lụrụ nwunye ya tupu ya eruo afọ iri abụọ.

  • Ozi dị n'akara Facebook ya gosiri na Charity Maduka gụrụ akwụkwọ sekọndịrị n'ụlọakwụkwọ Nnewi Girls, ma gakwaa mahadum n'ụlọakwụkwọ 'Collage of Education' dị na Nsugbe
  • Oge ha abụọ lụrụ, Cosmas Maduka abụghị ọgaranya mana nna Charity bụ onye ọgaranya a ma ama."Mana o nwere ihe ọ hụrụ n'ime m nke mere o ji kweta na ọ ga-alụ m," Cosmas kwuru.
  • Ha abụọ hụrụ onwe ha n'ụlọụka oge Cosmas dị afọ iri na asatọ, o wee kpebie na ọ bụ ya ka ọ ga-alụ.
  • N'ime afọ abụọ ha hụrụ onwe ha ka ha agbaa akwụkwọ."
  • Ọ bụ Charity Maduka bụ osote onyeisi ụlọọrụ Coscharis.
  • Ọ bụ mbido aha Cosmas na Charity ka ha ji mepụta aha ụlọọrụ ha (COSmas na CHARIty = Coscharis).
  • Coscharis na nwunye ya ebiela afọ iri anọ na atọ na-enweghị esemokwu ọbụla, dịka o si kwuo.

Cosmas Maduka kọkwara etu ya na nwunye si zụlite ụmụ ha niile n'ụzọ kwụ ọtọ.

O kwuru na ha enweghị onyonyo TV n'ụlọ ha oge ụmụ ha na-etolite.

Nke a bụ iji kuziere ụmụ ha mkpa ọ dị itinye uche n'agụmakwụkwọ ha ma hapụ ihe ga-emesa ha anya.