You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Stanley Okoro, onye ihe ejije a ma ama alaala mmụọ
Igwe mmadụ si mpaghara Naijiria dị iche iche, ọkachasị ndị na-eme ejije tụrụ n'Amabriba dị n'Ananri, Enugwu Steeti, n'ngwụrụ Stanley Okoro n'abali Ọnwa Ọgọstụ, afọ 2021.
Okoro, onye e ji 'Ibu Junior' mara nwụrụ n'abalị 11 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021 ka ọ gbachara afọ 29, dịka ọ rịachara ọrịa nwa oge.
Tupu ụbọchi olili ya, a mụrụ Okoro anya abali n'Owere, Imo steeti, bụ ebe o bi were na-eme ihe ejije.
Stanley Okoro, onye ihe ejije a ma ama alaala mụọ
Anyammiri na arịrị ejuola ọtụtụ ndị na-eme ejijje na ndị ihe ha na-amasị ọnụ dịka ọ pụtara ihe na Stanley Okoro, onye ihe ejije Nollywood a ma ama alaala mụọ ka ọ gbachara afọ 29.
Dịka otu enyi ya ma bụrụkwa onye nchịkọta otu jikọrọ ndị na-eme ihe ejije a kpọrọ 'Actors Guild of Nigeria', ngalaba nke Ọlụ, bụ Holy Chidi Okorie, siri gwa BBC Igbo, Okoro nwụrụ ụnyahụ bụ Wenezde, abalị 11 nke ọnwa Ọgọstụ afọ 2021 ka ọ rịachara ọrịa obere oge.
Okorie sịrị, "Nwanne ụnyahụ ka o kwuru na obi na-atachị ya, (breathlessness), ọ naghị ejelikwa ije n'ihi na ụkwụ ya zara aza."
"E bugara ya ebe a na-agwọ ya. Ụtụtụ ụnyaahu (11/08/2021), o bilie gagharịcha, mana oge mgbede, ozi bịara na ọ nwụọla."
Ọnwụ Okoro na-abịa abalị ole na ole onye ejije Nollywood ọzọ bụ Rich Oganiru nwụchara ka ọ rịachara ọrịa ogologo oge.
Ihe ndị ịmaghị maka Stanley Okoro:
- Okoro bụ onye Enugwu steeti
- Ọ gbara afọ 29 tupu ọ nwụọ n'abalị 11 nke ọnwa Ọgọstụ, afọ 2021
- Ọtụtụ ihe ndị mmadụ ji mara onye ọkpaọchị a bụ 'Stanley Rabbi', ebe ụfọdụ ji 'Ibu Junior' mara ya.
- O sonyela n'ọtụtụ ihe onyonyo gụnyere "Marrige War", bụ ebe o mere agwa 'osinri'.
- Ejije ndị ọzọ o soro bụ; "The Pocket Book" "50 Cent", the "Tailor" "Behind the Mask", "The Dark Knight"na ndị ọzọ.