Awkuzu Junction Attack: Ihe mere n'etiti ndịagha mmiri na ndị 'unknown gunmen'

Ndịagha mmiri Naijiria ekwuola na ndị otu ha gburu ndị ji egbe wakpoo ogige ha dị n'Awkuzu Junction, Anambara Steetị n'ụbọchị Mọnde 9 Ọgọstụ 2021 dịka 'nọrọ n'ụlọ' nke otu Ipob hiwere na-aga.

Akụkọ kwuru na ndị bu egbe wakporo ogige ndịagha mmiri dị n'Awkuzu Junction, Anambara Steetị, ebe ahụ ha na ndịagha mmiri a malitere ịkwakọrịta onwe ha mgbọ nke butere ọnwụ ụfọdụ ndị mmadụ.

Kepukepu na-ekwu na a gbagburu ndị ọrụ ndịagha mmiri abụọ mana mana onyeisi ndịagha mmiri n'Ọnịcha bụ Adekunle Okeniyi sị na akụkọ na e gburu ndịagha ha bụ asị ọcha.

Kama ọ sị na ndịagha mmiri gbagburu ndị ji egbe mmadụ isii mgbe ha bịara ịwakpo ogige ha dị n'Awkuzu.

Okeniyi gaara n'ihu kwuo na o nweghi ọkọ ọbụla kọrọ onye agha ha ka ọ fọdụzie ogbugbu.

Ọ dọọrọ aka na ntị ka ndị mmadụ ghara ịgbasa akụkọ ụgha.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndịagha mmiri n'Anambara n'ekwentị mana ọ zaghị ruo mgbe akụkọ a pụtara.

Cheta na otu Ipob iwu ka ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ n'ụbọchị 9 nke Ọgọstụ dịka ha na-eti mkpu ka gọọmentị tọhapụ onye ndu ha bụ Nnamdi Kanu e ji eji.

Ọtụtụ ndị mmadụ rubereisi n'iwu a n'obodo ndị dịka Aba, Owere, Onicha, Ọka nakwa n'ọtụtụ mpaghara, ebe ụfọdụ ndị nupuru isi tụnyere ndụ ha, ụgbọala ha maọbụ ngwaahịa ha.