Etu ndị ji egbe siri gbuo ndị uweojii na ndị nkịtị n'Enugwu na mgbede Wenezde

Egwu dị n'obodo Obeagu Uno, Ọkụnanọ nke dị n'Enugwu Steeti ebe ndị oji egbe wakporo ma gbuo ndị uweojii n'elekere 6:45 nke abalị n'ụbọchị Wenezde.

Otu onye hụrụ mgbe ya bụ ihe mere kwuru na ndị a bu ụgbọala Hilux ọcha, mgbe ndị uweojii na-akwụsị ha, na ha kuturu ma rịa otu onye uweojii elu.

Mgbe nke a mere ka ha na ndị uweojii bidoro gbarịtawa mgbọ.

Onye a kọwara na ndị a ji ihe kpuchie ihu ha niile.

O kwuru na ihe ruru ndị uweojii asaa maọbụ isii nwụrụ na ya bụ mkpamkpa.

O gwara BBC Igbo na mgbọ tụkwara nwunye ya dịka ndị mmadụ nọ ebe ahụ gbara ọsọ gbaba n'ime ọhịa.

Onye a kwuru na ndị oji egbe a jụrụ sị, " kedụ ebe ndị uweojii nọ, na ha pụta ma ọ bụrụ na obi kara ha?".

O kwuru na ndị a mechara were mmanụ ụgbọala mụnye ụgbọala ndị uweojii ọkụ.

Dịka o siri dị, onye ntaakụkọ anyị ruru ebe ahụ chọpụtara na ndị uweojii abịala buru ozu ndị nke ha.

O kwukwara na ndị a mechara buru ụgbọala ha gawa Amagunze.

BBC Igbo kpọtụrụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Daniel Ndukwe n'ekwe ntị ya, o zitere ozi were sị na ọ bụ eziokwu na awakporo ndị uweojii na Ogeagu-Amechi na Agunzu nke dị na mpaghara okpuruọchịchị Nkanu.

O kwuru na ha ebidola nyocha ha ma sị na ha ga-ekwuputa mpụtara nyocha ha mgbe ha mechara.