Lady Victoria Aguiyi-Ironsi: Mama m bụ onye na-achọ udo mgbe niile - Susan Aguiyi Ironsi

Anyị mmiri na-ekwo ebe niile dịka eliri Lady Victoria Aguiyi Ironsi n'ụbọchị Fraịde nke ise ọnwa Nọvemba n'Afaraukwu dị n'Abia steeti.

Ndị mmadụ pụtara n'uju ha iji kwanyere ezi nwaanyị ahụ bụ nwunye Aguiyi Ironsi ugwu ikpeazụ.

Otu nwa ya nwaanyị bụ Susan Aguiyi Ironsi gwara ndị ntaakụkọ nọ ebe ahụ nakwa ọha mmadụ sị "Mama m bụ onye na-achọ udo mgbe niile".

O kukwara na nne ye biri ndụ ume all oge niile tupu ọ nwụọ ma kwuo na ọnwụ ahụ na-ewute ha bụ ndị ezinaụlọ ya.

Cheta na otu Ohaneze Ndigbo tụrụ arịrị makwa ọnwụ ya ma kpọọ ya "ada Igbo ji eje mba" mgbe ọ nwụrụ n'ọnwa Ọgọstụ.

Ihe i kwesiri ịma maka Victoria Aguiyi-Ironsi

  • A mụrụ Odoziakụ Aguiyi-Ironsi n'ụbọchị 21 nke ọnwa November 1923.
  • Ọ bụ ya bụ onye mbụ nọ n'ọnọdụ dịka "First Lady" nke abụọ na Naịjirịa.
  • Otu Ohaneze hụtara ya dịka onye ji ekpere na nkwado pụrụ iche nyere di ya bụ Ironsi aka n'ọkwa onyeisiala oge, ihe onye bụ na- abụghị okpukperechi maọbụ mpaghara onye si na-ekwu onye a ga-enye ọkwa
  • Ironsi hụchatara ya ebe oso ụmụada ibe ya ete egwu dịka ọ gara mmemme iriji ọhụrụ e mere n'obodo ha na obodo ya gbara agbata obi ma site ebe ahụ jụwa ese ma ma lụọ ya
  • Ya na Ironsi mụrụ ụmụ Itoolu

Lady Victoria Aguiyi-Ironsi na Lady Adanma Okpara bụ ụmụada Igbo e ji ama atụ - Ohaneze

Otu Ohaneze atụọla atụọla arịrị maka maka ọnwụ adagbo abụọ eji eje mba bụ Oriakụ Victoria Aguiyi Ironsi na Adanma Okpara bụ ndị nwụrụ abalị ole na ole gara aga.

N'ozi ha wepụtara n'abalị Monde nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Alex Ogbonnia binyere aka, Ohaneze kwuru na ha abụọ bụ "ụmụada Igbo e ji ama atụ."

Ohaneze sịrị na n'agbanyeghị na di ụmụnwaanyị abụọ ahụ nwụnarịrị ha n'oge, na ha kwusiri ike n'ịgba mbọ ma gbaziere ụmụ ha ụzọ ịgba mbọ dịka e jiri mara ndị Igbo.

Ha sịrị, "di Victoria and Adanma hapụrụ ha laa mmụọ n' oge mana ha jichiri onwe ha kwudozie ike , gbaziere ụmụ ha ụzọ.

"Nke a bụ ọmụma atụ agwa ndị Igbo nke gbadoro ụkwụ na ịgba mbọ, irusi ọrụ ike na ịtụkwasị obi na Chineke."

Ohaneze kwuru na na agbanyeghị na di ya chịrị dịka onyeisiala Naijiria naanị ọnwa isii Oriakụ Victoria Aguiyi Ironsi, "gosiri iji ugwu na ebube nọọ n'ọkwa ya dịka nwaanyị mbụ Naijiria"

N'aka nke ọzọ, Ohaneze toro Adanma Okpara maka ịgụwa akwụkwọ isi "oge naanị ụmụ ndị ọgaranya na ndị ma oke akwụkwọ na-agụ akwụkwọ."

Lady Victoria Aguiyi-Ironsi na Lady Adanma Okpara alaala mmụọ n'afọ 97 na 96

Ozi si Abia Steeti apụta na-akọwa na Victoria Nwanyiocha Aguiyi-Ironsi, bụ nwunye onye agha mbụ chịrị Naịjirịa bụ Johnson Aguiyi-Ironsi nwụrụ, dịka gọọmentị steeti ahụ sị na odoziakụ Adanma Okpara bụ nwunye aka chịbụrụ Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa bụ Michael Iheonukara Okpara alakwuola mmụọ.

Odoziakụ Aguiyi-Ironsi nwụrụ n'ụtụtụ Mọnde, bụ ụbọchị 23 nke ọnwa Ọgụstụ, 2021, dịka ụfọdụ ụlọntaakụkọ siri kwuo.

Ebe Odoziakụ Okpara nwụrụ n'ehihe Sọnde, dịka gọọmentị Abia siri kwuo.

Odoziakụ Aguiyi Ironsi dị afọ 97 ebe Odoziaku Okpara dị afọ 96 mgbe ha nwụrụ.

E gburu Aguiyi-Ironsi n'afọ 1966 na nchụtu gọọmentị n'ike nke ndị agha si mpaghara Ugwu Naịjirịa mere.

Ihe i kwesiri ịma maka Adanma Okpara

  • Odoziakụ Okpara n'onwe ya bụ nwaanyị mbụ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dịka di ya nọ n'ọchịchị site afọ 1959 ruo 1966.
  • Ndị mmadụ ka na-echeta ọchịchị ha dịka etu ha siri mepute ọtụtụ ihe ọpụrụiche a ka na-ekwu maka ha ruo ugbua.
  • Odoziakụ Okpara bụ nwaanyi ajadu kemgbe afọ 1984 di ya nwuru.
  • Ọ bụ nwaanyị gụrụ akwụkwọ oge ezi dị nukwu ụkwa
  • Ọ gara akwụkwọ Praịmarị n'ụlọakwụkwọ 'Central School, Ndoro, Ikwuano Oboro', St Mary Flanney Memorial School, Oron.
  • Onye nkuzi, Odoziakụ Okpara gara ụlọakwụkwọ ọzụzụ Ụmụnwaanyị bụ "Women Training College, Umuahia.
  • Ọ gakwara gụọ akwụkwọ n'Alabekee na 'Westhill Teachers College, Selly Oak Birmingham, dị na mba Briten'.
  • Odoziaku ọkpara kuziri n'ụlọakwụkwọ dị iche iche gụnyere Girl's School, Ovim malite n'afọ 1942 rue afọ 1943; Women Training College, Umuahia malite afọ 1944 rue afọ 1947
  • Ọ lụrụ M. I Okpara n'afọ 1949.
  • Ọ rụrụ dịka onyeisi n'ụlọọrụ Mitchelson Nigeria Ltd nke di ya bụ Dr. M.I. Okpara tọrọ ntọala ya.

Gọọmenti Abia na-ekwu na ọ bụ ọtụtụ agwa ọma ka ha ji echete Odoziakụ Okpara.

Gọọmentị Abia ekwughi ihe gburu ada ukwu ha a.

Gọọmentị Anambara esorola n'ime ndị na-eru uju banyere ụmụnwaanyị abuọ nwụrụ.

Site n'akwụkwọ mgbasaozi Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na Steetị ahụ bụ Don Adinuba binyere aka, ha sị na mmadụ abụọ a bụ ndị Igbo ji eje mba a ga-echete tee aka maka ọrụ ọma ha rụrụ.

Ndị na-echete Odoziakụ Okpara na Aguiyi-Ironsi karịa bụ ụmụ, ụmụ ụmụ, na ụmụ ụmụ ụmụ ha.

Akụkọ ka na-abịa.