You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Igbo Presidency 2023: Ihe ị kwesịrị ịma maka Chris Ngige chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala
Chris Ngige abụrụla onye ọhụrụ sonyere n'ogologo ahịrị ndị chọrọ ịzọ ọkwa onyeisala Naịjiria n'afọ 2023.
Ngige bụ Minista na-ahụ maka Ọrụ na Inwe ọrụ, kwuputere mmasị ya iso zọọ ọkwa a n'ihu ọha gbakọrọ n'obodo ya n'Alor, n'ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelụ 2022.
O kwuru na ihe mere o ji azọ ọkwa a bụ na ọ na-anụ ya ọkụ n'obi ịhụ Naịjiria ebe ọganihu, ịdịnotu na nhatanha juputara.
Kemgbe o kwuputere mmasị ya, ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụ ụdịrị ọchịchị ọ chọrọ ịchị ebe ụmụakwụkwọ mahadum agabeghi akwụkwọ kemgbe ihe karịrị otu ọnwa, n'ihi abụbụọrụ ndị nkuzi gbara maka ụgwọ e ji ha.
- A mụrụ Chris Nwabueze Ngige n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Ọgọst afọ 1952
- Ọ bụ onye Alor dị n'okpuruọchịchị Idemili South, n'Anambra steeti
- Ọ chịrị Anambra steeti dịka gọvanọ site n'ọnwa Mee afọ 2003 ruo Maachị afọ 2006, n'okpuru pati PDP
- O si pati People's Democratic Party (PDP) wụbanye pati Action Congress of Nigeria (ACN) n'afọ 2011, nke so na pati ndị e kpokọtara iji hibe pati All Progressives Congress (APC)
- Ọ zọtara oche ụlọomeiwu ukwu ebe ọ nọchitere anya ndị Anambra Sentralụ site n'afọ 2011 ruo afọ 2015 mgbe Sinetọ Uche Ekwunife meriri ya na ntuliaka
- Ọ bụ minista na-ahụ maka Ọrụ na Iwe n'ọrụ kemgbe 11 nke ọnwa Nọvemba afọ 2015 ruo ugbua
- Aha otutu ya bụ Ọnwa.
Rochas Okorocha awụfela PDP n'ezie?
Dịka kepukepu na-efegharị na aka chibụru Imo Steeti bụ Rochas Okorocha esile otu patị All Peoples Congress (APC) were banye otu People Democratic Party (PDP), o sitere n'ọnụ onye na-ekwuchitere ya bụ Ebere Nzewuji were sị na ọ ka nọkwa na otu patị APC ma nọsie ike.
Dịka o siri dị, lee ndị ụfọdụ ndị Igbo wepụtarala onwe ha maka ịbụ onyeisiala Naijirịa.
Ije Rochas Okorocha na otu ndọrọndọrọ ọchịchị na Naijirịa
N'Afọ 2011, Rochas Okorocha si otu pati PDP were banye otu All Progressive Grand Alliance (APGA) were zọọ ọkwa gọvanọ Imo Steeti e kwesịrị ime n'afọ 2011.
N'ọnwa Disemba afọ 2010 ndị APGA machiri ya maka ha sị na ọ kpara akwa na-abụghị maka ọdịmma patị ha.
N'ọnwa Maachị afọ 2013 ka Rochas na ndị ọzọ wepụtara otu patị App Progressive Congress.
N'ọnwaMaachị afọ 2019, otu APC machịrị Rochas maka ịkpa agwa ha sị na omegidere ọdịmma Patị ha.
Okorocha ṅụrụ iyi ọrụ dịka onye ome iwu na-anọchite anya Imo-west n'ụlọ omeiwu n'ọnwa Jun afọ 2019.
Ndị Igbo pụtarala ịzọ ọkwa onyeisiala Naijirịa n'afọ 2023
Rochas Okorocha
Rochas Okorocha bụ aka chiburu Imo Steeti afọ asatọ malite n'afọ 2011 ruo 2019 ma bụrụ Sịnetọ na-achịteanya Imo West n'ụlọomeiwu Naịjirịa.
Ọnụ na-ekwuru Okorocha kwuru na Okorocha tozuru ịbu onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.
Cheta na otu kpọrọ onwe ha "Council of Imams and Bishops" pụtara n'ụbọchị Wenezde tụọ Okorocha aka dịka onye ha kwadoro maka ọkwa onyeisiala afọ 2023.
Mana Nzewuji kwuru na Okorocha ga-ekwu okwu banyere nke a n'oge na-adịghị anya.
O kwuru sị: "Okorocha nụrụ ihe ndị Bishopụ na Imam kwuru na ọ bụ ya bu onye nwereike ịmezi Naịjirịa."
"Rochas bụ onye a ma ama ebe niile na Naịjirịa, ọ na-asụ asụsụ ndị ọzọ, ọ bụghị naanị Igbo."
"Ọ na-eje ihe ndị alakuba na-eje ihe ndị okpukpere Kraịst, bụ ihe mere ka ndị Bishọpụ na Imam kwadoo ya ịnọchi Buhari maka udo na idinotu Naịjirịa."
Nzewuji gara n'ihu kwuo na oge ruo, Okorocha n'onwe ya ga-agwa ndị mmadụ uche ya gbasara ịzọ ọkwa onyeisiala
Ugboro ole Okorocha zọrọla ọkwa onyeisiala
Tupu ọ bụrụ gọvanọ Imo Steeti, Rochas Okorocha azọọla ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'oge gara aga.
N'afọ 2003, ọ zọrọ ya bụọkwa na pati 'All Nigeria People's Party (ANPP)'.
O mechara banye PDP sorokwa zọọ ya bụ ọkwa n'afọ 2007, tupu ọ banye APC zọkwaa ọkwa Onyeisiala n'afọ 2015.
N'ọnwa Sepụtemba afọ a, Rochasgwara ndị ntaakụkọ sị: "Ọ bụrụ na m bụrụ onyeisial, udo na ọganihu ga-abụ ụba na Naịjirịa, mara na achọrọ m ịbụ onyeisiala.
Ọ bụghị naanị Rochas Okorocha bụ onye Igbo a na-enyo na o nwere ike ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023.
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị ebiriwala ọkụ na Naịjirịa maka na oge a ga-eme ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa na ụfọdụ ndị gọvanọ eruwela ọzọ.
Ntuliaka onyeisiala Naiji ga-adị n'ọnwa Febụwarị afọ 2023 dịka a na-emekaarị ya kwa afọ anọ ọbụla.
Ọtụtụ ndị si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ekwu na ọ bụ oge ha iwepụta onye ga-abụ Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.
N'ihi ya. ụfọdụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị si mpaghara ahụ amalitela ikwupụta uche ha n'ịzọ ọkwa a.
Ndị a gụnyere; David Umahi bụ gọvanọ Ebonyi Steeti, Anyim Pius Anyim bụbu onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa, Orji Uzor Kalu bụ aka chịburu Abia Steeti.
Davido Umahi
Gọvanọ David Umahi bụ gọvanọ Ebonyi Steetị gara zute Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja na Tuzde bụ ebe ọ gwara ya ebumnobi ya ịzọ onyeisiala.
O kwuru na ọ ga-eji ọkọlọtọ All Progressive Congress (APC) wee zọọ ya.
Umahi bụ onye obodo Uburu dị n'okpuru ọchịchị Ohaozara dị n'Ebonyi Steeti. A mụrụ ya n'ọnwa Jenụwari afọ 1964.
Ọ zọrọ ọkwa gọvanọ n'aha PDP n'afọ 2015 ma merie, zọọkwa nke ugboro n'afọ 2019 ma merie ọzọ.
Umahi mechara hapụ pati PDP mabanye n'APC n'ọnwa Nọvemba, afọ 2020.
Anyim Pius Anyim
Anyim Pius Anyim n'otu aka ahụ kwupụtara mmasị ya ịzọ ọkwa onyeisiala.
Ọ bụ onye mbụ si mpaghara Ọwụwa Anyanwụ na-ekwupụta mmasị ya ịzọ ọkwa ahụ n'afọ 2023
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya:
- A mụrụ Anyim Pius Anyim n'ụbọchị 19 nke ọnwa Febrụwarị 1961.
- Ọ bụ onye Ishiagu dị n'okpuruọchịchị Ivo dị n'Ebonyi steeti.
- Ọ gara mahadum Imo steeti site n'afọ 1983 ruo 1987, mgbe ọ ka dị n'Uturu dị n' Abịa steeti ugbua.
- Ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị n'afọ 1998, n'okpuru 'United Nigeria Congress Party' (UNCP) ebe ọ nọ zọta oche Ụlọomeiwu, mana ọnwụ Ọchịagha Sani Abacha bụ onyeisiala mgbe ahụ kagburu mmeri ahụ.
- Ọ zọtara oche Ụlọomeiwu Ukwu n'afọ 1999 (n'okpuru pati 'Peoples Democratic Party' (PDP), ebe ọ nọ na-anọchite anya mpaghara ndị Ebonyi-South.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi ụlọomeiwu Ukwu Naịjirịa n'okpuru ọchịchị Onyeisiala Olusegun Obasanjo malite n'afọ 2000 ruo 2003; ọ nọchiri Chuba Okadigbo n'ọkwa ahụ
- Ọ nwara ịchụtu Obasanjo n'oche ọchịchị site n'usoro ndị Ụlọomeiwu n'ọnwa Juun afọ 2002, mana e biri ya aka n'ala.
- N'ọnwa Ọgọst 2002, o kwuputekwara na ọ gaghị amasị ya ka ndị ji ọkwa mgbe ahụ zọọ ọkwa nke ugboro abụọ; ya na onwe ya azọghịkwa ọzọ.
- Ọ nwara ịbụ onyeisioche otu pati PDP n'afọ 2007/2008, mana a họpụtara onye ọzọ bụ Vincent Ogbulafor.
- N'ọna Jenụwarị afọ 2010, o du ụfọdụ ndị nwere agba na-akpọ oku ka Onyeisiala Umaru Musa Yar'Adua kwuputa na ahụ adịghịzị ya nke ga-egbochi ọchịchị ya. Nke a mepere ụzọ Goodluck Jonathan ji banye ọchịchị.
- N'afọ 2011, e were ya n'ọrụ dịka Odeakwụkwọ gọọmentị etiti 'Secretary to the Government of the Federation (SGF)' ebe ọ rụrụ ruo 2015.
- N'afọ 2021, ya na Dave Umahi bụ aka na-achị Ebonyi steeti nwere okwu butere ọchụchụ ndị na-arụ n'okpuruọchịchị Ivo.
- Ọ bụ naanị ya bụ onye Igbo kwurula kpọmkwem na ya ga-azọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
- N'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ n'ọnwa Ọkụtoba, o kwuru na oge eruola ugbua ka ya kwuputa mmasị ya iso zọọ ya bụ ọkwa.
Orji Uzor Kalu
Orji Uzor Kalu bụ aka chịrị Abia steeti malite n'afọ 1999 ruo 2007, mana ugbua ọ bụ Sinetọ na-anọchite anya Abia 'North' n'ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa.
Na mkparịtaụka ya ba Channels TV nwerem Kalu sị "Adị m njikere ịzọso Bola Ahmed Tinubu ọkwa Onyeisiala n'aha pati APC".
Kalu kwuru nke a dịka Tinubu chiburu Legọs Steeti pụtara ma kwuo na ọ ga-azọ ọkwa onyeisiala.
Ọ sị na ihe ọ na-eche bụ ka pati APC kwupụta na ọ bụ ndị Ndịda Naịjirịa ga-enwe ohere ịhọpụta onyeisiala Naịjirịa.
N'ọdị nso a ka foto ya malitere ịgbasa n'Umuahia, na-egosipụta na ọ chọrọ iso zọọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa na 2023.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo, Kalu kwuru na ya toruru ịbụ onyeisiala Naịjirịa, mana ọ bụ ihe Chukwu kwuru ga-eme.
Chetakwa na Kalu so na ndị nwere ọgbakọ a kpọrọ "Igbere Declaration", ebe a nọrọ kpọọ oku ka pati APC na PDP họpụta onye Igbo maka ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023.
Ndị ọzọ a na-atụanya nwereike ikwupụta ebumnobi ha
Dịka a na-ekwusi ike na ọ bụ ndị Igbo ka o rutere iwepụta onyeisiala Naịjirịa ma Buhari rituo.
Ndị ọzọ a na-atụ anya nwereike isonye n'ọsọ ọkwa Onyeisiala nke afọ 2023 gụnyere;
Chibuike Amaechi
Amaechi bụ aka chịburu Rivers steeti, ma bụrụkwa Mịnịsta na-ahụ maka njem ugbua.
O kwubeghị kpọmkwem na ọ chọrọ ịzọ ọkwa onyeisiala, mana ọtụtụ na-ekwu na uche ya dị ya.
Oge Amaechi na BBC Igbo nwere mkparịtaụka n'afọ 2020, anyị jụrụ ya ihe o che gbasara ọkwa onyeisiala n'afọ 2023, o kwuru na sị: "enweghị ihe m ga-ekwu. Ugbua, abụ m onye ọrụ gọọmentị."
Mana n'agbanyeghị nke a, ọtụtụ na-ekwu na Amaechi nwere ike ịzọ ọkwa onyeisiala na 2023.
Peter Obi
Obi so zọọ ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nke afọ 2019, dịka ọ zọrọ ọkwa osote onyeisiala, ya na Atiku Abubakar.
Mana foto malitere ifegharị n'ọnwa sepụtemba afọ a, nke na-ekwu na ọ na-apụta ịzọ ọkwa onyeisiala.
Foto ahụ gosiri na aka chịburu Kano steeti bụ Rabiu Kwankwanso na-apụtakwa dịka osote onyeisiala.
Mana Peter Obi kwuru na aka ya na ụkwụ ya adịghị na ya bụ foto.
O kwuru sị: "Ihe kwesịrị ịka mkpa ugbua bụ etu onye ọbụla ga-esi gbakọta aka ka anyị nwee ezi nchekwa, kpochapụ ụbịam, nye ndị mmadụ ọrụ, wulite ọnọdụ agụmaakwụkwọ nakwa ahụike na Naịjirịa, ọ bụghị onye ga-abụ onyeisiala."