You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Chris Ngige: Gịnị butere minista ọrụ n'ihu ndị omeiwu?
Okwu a kpụ n'ọnụ ugbua bụ nke gbasara Minista na-ahụ maka ọrụ bụ Chris Ngige na ndi omeiwu na-eme nnyocha ngalaba ọ nọ n'isi ya.
Okwu a malitere dịka Ngige chụrụ ndị na-achị ngalaba a kpọrọ Nigeria Social Insurance Trust Fund (NSITF) n'ọnọdụ nwa mgbe nta iji nye ohere ime ha nnyocha maka ebubo nrụrụaka.
N'ụbọchị 22 nke ọnwa Jụlaị, Ngige zutere ndị omeiwu na-eme nnyocha were kwuo na ọchụchụ a ọ chụrụ ndị a zirị ezi makana ọ bụ n'aka Onyeisiala Muhammadu Buhari ka o nwetara ikike.
Ihe mere ọchuchụ ndị isi ọrụ Nsitf jiri chọọ ịbụrụ atakataagbụọ
Ọ bụ n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jụlaị ka Ngige binyere aka n'akwụkwọ mkpebi ịkwụsị Adebayo Somefun bụ onyeisi NSITF na ụfọdụ ndị otu ya ọrụ nwa mgbe nta dịka ebubo na ha gbariri Naịra 3,400,0000 n' ọrụ adigboroja.
Ebubo a sị na ọ bụ ọrụ 196 ka a gbarịrị ego a iji gbanarụ ịnata ikike n'aka otu Bekee kpọrọ "Ministerial Tenders Board" nakwa ọgbakọ ndị na-achị Naịjirịa bụ "Federal Executive Council".
Nkwụsị n'ọrụ nwa mgbenta na-abịa ka Odeakwụkwọ Ukwu Naịjirịa nyere iwu ka ndị mịnịsta kwụsị ịchụ ndị isi ngalaba nọ n'okpuru ha.
'A na-emefu ego aghara aghara ebe a'
Dọkịta Ngige na-akọwa na nnyocha akwụkwọ Onye Mgbakọ Ukwu Naịjirịa wepụtara nke Bekee kpọrọ, "Auditor-General's Specific Periodic Check", nke 2013 ruo isi mbido 2018 gosiri na ịda iwu gọọmentị hibere maka ịzụta ihe bụ ihe ndị ọhụrụ na-achị ngalaba ahụ na nke ochie na-eme.
"N'ihi ụdị agwa ha kpara, dịka o si metụta ọdịmma Naịjirịa, a gwara m onyeisiala ma nata ya ikike iwepụ ndị isi a n'ọrụ."
Ọ sị na Onye Ode Akwụkwọ Ukwu Naịjirịa nyere ya akwụkwọ ozi n'ụbọchị 30 nke ọnwa Juun ebe ọ sị ka ọ gaa n'ihu n'ime ihe niile ọ chọrọ ime banyere iwu a ndị a dara.
Ọ sịkwa na akwụkwọ ahụ gwara ya zite ihe akaebe etu e si mee ya bụ ihe.
Ngige si na ya gara n'ihu hibe otu a kpọrọ na Bekee "Presidential Joint Board Committee" nke gụnyere ndị isi ụlọọrụ onyeisi ndị ọrụ gọọmentị Bekee kpọrọ "Office of the Head of Service"(OHOSF), nke "Auditor General of the Federation" (AuGF), nke "Accountant General of the Federation" (AcGF) nakwa nke "Federal Ministry of Labour and Employment".
Ọ sị na ọ bụ onyeisi nnyocha ndị na-elekọta ngalaba a kpọrọ "NSITF Board Audit Committee" nọ n'isi ọgbakọ a kwesiri inyocha mpụ na nrụrụka a na-ebo.
Ihe ọzọ Ngige rụtụrụ aka
- Ọ sị na NSITF enyeghị ya mgbakọ mkpata na mmefu ngalaba ha dịka ha kwesiri ime kwa ọnwa
- Ọ sị na ha enweteghi akwụkwọ etu ha sị mefuo ego nke ha kwesiri ime kwa afọ bụ nke ọ sị ga-enyere ya aka dere onyeisiala ihe akaebe etu ihe siri kwụrụ
- Ịda iwu aghara aghara banyere etu e si azụta ihe
- Ịkwụ ụgwọ n'ụzọ ezighi ezi maọbụ na anataghị ikike
- Ịkwụ ụgwọ ọrụ na-ahụghị ọrụ a rụrụ
- Ị ga njem ezumike na mba ofesi na-enweghị ikike
- Ịgbanwe ihe e nyere ikike ịzụ iji were zụọ ihe ọzọ.
Ịsị mmadụ nọrọ n'akụkụ abụghị ịchụ ya n'ọrụ kpamkpam
Dịka Ngige siri kwuo, ndị a e wepụrụ n'ọrụ bụ iji nye ohere ime ha nnyocha ọfụma ọ bụghị na a chụrụ ha n'ọru kpamkpam.
Ọ sị; " Ihe bụ ohere ha ịzara ọnụ ha."
Ka okwu si kwụrụ ugbua
Ngige ezutela ndị omeiwu na-eme nnyocha maka ihe mere e jiri kwụsị ndị isi Nsitf n'ọrụ dịka nke o hibere ka na-agakwa n'ihu.
A na-elezi anya mpụtara nnyocha ndị a dika ọtụtụ mmadụ na-eche ịmata ihe ọ ga-apụtara gọọmentị Buhari dịka ha ka na-ekwusi okwu ike na ha na-ebuso nrụrụaka agha.