Ihe i kwesiri ịma tupu i yiwe 'waist trainers'

    • Onye dere ya, Chimezie UcheAgbo
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo, Lagos

Nke na-ewuru ụmụnwaanyị kamgbe ụwa bụ inwe ahụ dịka ịkọ mmanya nke a kpọrọ 'hours glass' na Bekee.

Ya bụ afọ tara ata, ara buru ebu na ukwu dọnyere adọnye kpọmkwem.

I nwee nke a, ị mara na i chizugo, bụrụzie olu gbajie ihe ọbụla nwere olu.

Ụdị ahụ a abụghị taa ka ọ malitere iwuru ụmụnwaanyị, mana ụzọ e si aga Ọnịcha dịghịghịkwanụ nso cha cha.

Ngala ụmụnwaanyị na-akarị akarị ma ha nwee ụdịrị ahụ mere ọtụtụ ji eforo ntutu taa ime ihe ọbụla ọ ga-eri iji nweta ahụ iko mmanya.

Mana ya bụ okwu inwetakwanụ afọ tara ata abụghị ugbo a na-aga ma e bughi mmiri maka na ụdị ahụ ndị Afịrịka nwere na-echere ha aka dị egwu, ọ na-arịa ahụ nke ukwuu ọkachasị maọbụrụ na nwaanyị amụọla nwa.

Nke a kpatara ha jiri malite iṅomi ihe ụmụnwaanyị ndị ọcha na-eme na ihe ha na-eyi iji nweta afọ tara ata nke a kpọrọ "Corsets" na Bekee.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị a ma ama dịka Beyonce, Kim Kardashian na-eyikwa ya ma na-egosi ya na soshal midia.

Ya mere ọtụtụ ụmụnwaanyị ji na-eyikwa ya bụ ihe nakwa nke a na-akpọ "Waist Trainers" bụ nke ị ga-eyi ma ị na-emegharị ahụ iji hazie afọ gị mee ka ọ baa n'ime.

Mana ajụjụ dị mkpa ịjụ bụ, ọ bụ naanị inweta afọ tara ata, kedụkwanụ maka ahụike nwaanyị na-eyi ihe ndị a? O nwere ihe ọ na-eme n'ahụ ya ka ọ dị mma iyiri na-aga?

BBC Igbo buru ajụjụ ndị a bugara Dọkịnta na-ahụ maka ahụike ahụ ụmụnwaanyị bụ Chidiebele Ojukwu.

Ọ gwara BBC Igbo na e nwere ọtụtụ ihe ndị na-eso iyi ya bụ ihe nke na-emegide ahụ nwaanyị n'ụzọ dị icheiche mana ụmụnwaanyị amaghị.

Ihe ise iyi 'corset' na 'waist trainer' na-eme n'ahụ nwaanyị.

1. Ọ na-afịkọ ihe dị n'ime ahụ nwaanyị dịka eriri afọ

Dịka dọkinta Ojukwu siri kwuo, etu "Corset" ebuba afọ mmadụ ime bụ na ọ na-afịkọ akwara afọ mmadụ ma jide ihe ndị dị n'ime afọ dịka eriri afọ na ihe ndị ọzọ kekọsịa ma bụgharịa ya ebe ha kwesiri idị. Ya bụ o si ebe eriri afọ kwesiri ịdi, bụgharịa ya maka na ohere adịghịzi ịnabata ebe ọ ga-anọ. Nke a nwereike ibute nsogbu dị icheiche so egwerighi nri nke ọma n'afọ mmadụ ga-ebute nsogbu afọ dị icheiche.

2. O nwereike imetta akụkụ ahụ dị n'ukwu nwaanyị nke a kpọrọ 'pelvic organ' na Bekee.

Ụfọdụ akụkụ ahụ ndị a bụ akpa nwa, akpa mamịrị na ndị ọzọ.

Oge nwaanyị yiri 'Corset', ọ ga-agbalite ndagide dị n'ime afọ ya nke ga na-ebudata akụkụ ahụ ndị ahụ dị ya n'ukwu n'ala nwereike ibute ihe a kpọrọ 'hermarhroids' na 'prolapse' na Bekee bụ ebe akpanwa si n'ikpu nwaanyị na-adapụta.

3. O nwereike ibute maamịrị ịdapụ nwaanyị n'ike.

Nwaanyị ji kọsetị ekechi afọ ya oge ọbụla na adagide akwara ndị dị n'ukwu ya ma n'afọ ya dịka Dọkịnta Ojukwu siri kwuo nke bụ na akwara ndị ahụ agaghị esizi ike nke ọma bụ na ọ chị a ọchị, maamịrị adapụta maọbụ na ọ gaghị akpadoli ahụ ma o jide ya.

4. Ọ na-eme ka afọ yọọ ayọ.

Akwara ndị dị n'afọ na-esi ike n'onwe ma na-adọtị na-adọbakwa n'akwa ya na-eye aka ikwagide azụ mmadụ na etu mmadụ si kwụrụ.

Mana oge nwaanyị jiri kọsetị kedo afọ ya, kama afọ ya ịrụ ọrụ ahụ, kọsetị ahụ ga na-arụ ya nke ga-eme na afọ ya ga-anọzi nkịtị, oge ọ kwụsịrị iyi ya, afọ ya aƴọ ayọ maọbụ ọ malite inwe azụ mgbu.

N'okwu Dọkịnta Ojukwu: "Ụfọdụ ụmụnwaanyị bụ ha yipu 'waist trainer' ha si hee!, afọ m atagọkwa mana afọ gị atago, gịnị ga-emezi ihe ndị nọ gị n'ime afọ?

Nwaanyị mụrụ yichaa kọsetị, ọ dị ime ọzọ, afọ ya ga-emepekwa karịa maka na afọ ya esighi ike ịrụ ọrụ imechi ya, kama ọ bụ kọsetị rụrụ ọrụ ahụ."

5.Ọ na-enye nsogbu n'iku ime:

N'okwu Dkt. Ojukwu; "Onye yi kọsetị anaghị ekuta ume nke ọma".

Oge mmadụ na-eku ume, akwara ndị nọ n'afọ kwesiri ijiri aka ya na-adọtị na-adọbakwa, i kuo ume, afọ gị ebuo ibu nweeike nabata ikuku, i kupu ume, ọ taa, kupu ajọ ikuku.

Mana i yiri kọsetị, afọ gị agaghị agbasa nke ọma ga-eme na ọ gaghị anabata ikuku nke ọma ma kupukwa ajọ ikuku nọ gị n'afọ makana kọsetị jikwara ya.

Nke a nwereike ibute ọtụtụ nsogbu n'ime ahụ mmadụ.

Dọkịnta Ojukwu kwuru: "I lechaa ụdị ihe a anya, kedụ ka ị ga-esi gwa mmadụ ya yiri 'Waist trainer" na-emegharị ahụ bụ mgbe o kwesiri ikumi ume ekumi maka ahụ ọ na-emegharị?"

O kwuru na oge mmadụ na anaghị eute ume nke ọma, ime ahụ ya agaghị enwetacha ezigbo ikuku.

6. Ọ bụrụ na akwara afọ gị ayọ ayọ ọ ga-emetụta akwara ukwu gị nke ga-emetụta etu i si enwe aramara.

Akwara ndị a dị n'ukwu nwaanyị bụ ihe gbara ikpu ya gburugburu na-eme na ọ bụrụ na o siri ike, ọ ga-ejikwa onwe ya nke ọma mana onye na-eyi kọsetị akwara ukwu ya yọrọ ayọ, ọ ga-eme ka akwara ikpu ya yọọkwa ayọ bụ na ikpu ya ga na-aga siriri werere.

Ọ gaghị ejikwata amụ nke ọma, dịka Dkt Ojukwu siri kwuo.

Ọ bụrụ na ikpu nwaanyị dịka ọmị, obi agaghị adị ma ya ma nwoke ya mma cha cha maka na aramara ha agaghị adị ụtọ etu o kwesiri.

Akwara nke a na-enyekwa aka ka nwaanyị nwee nke a kpọrọ 'orgasm' maka na ọ bụ ya ga na-akwakọ ọnụ ma nwaanyị nwee 'orgasm'.

Nwaanyị ọ ga-eyili kọseti chacha?

Dkt Ojukwu kwuru na nwaanyị nwereike iyi kọsetị n'ime akwa ya iji nye ya ụdị ahụ ahụ ọ chọrọ mana ọ gaghị eyi ya ogologo oge maka na nsogbu so ya n'ọdịnaihu karịri akarị.

Ọ bụrụkwa na i nwere nsogbu dịka ejikwaghị maamịrị, i kwesighi iyi ya cha cha dịka Dkt Ojukwu siri kwuo.

Onye na-emegharị ahụ ekwesighikwa iyi ya cha cha, jiri aka gị rụọ ọrụ n'akwara afọ gị ka ọ gbasie ike, jikwa gị nke ọma.

Nwaanyị mụrụ nwa o kwesiri iyi ya?

Dọkịnta Ojukwu kwuru na nwaanyị mụrụ nwa ekwesighi iyi ya maka na ọ bụghị naanị maka ibuba afọ, o kwesikwara ile anya maka ahụike ya.

Nwaanyị mụrụ nwa, afọ ya adọsala adọsa maka afọ ime.

Akwara ukwu ya ma akpa nwa ya gbaturu agbatu maka nwa nọbu ya n'afọ, i werekwa kọsetị kechie ya ghara ikwe ka ọ gbadachaa, ọ ga-eme na akpanwa ya nwereike ọ gaghị alaghachị azụ ebe o kwesiri, ọ ga na-ehikwa maamịrị na ahụ, o nwekwara ike inwe "prolapse".

O kwuru na kọsetị ndị a na-arụ bụ akwara dị mmadụ n'ime afọ a kpọrọ 'Transverse Abdominus muscle' bụ ihe a na-amụta eṅomi.

Maka na akwara ahụ, si n'azụ mmadụ jịkọọ afọ gị gaa n'ihu.

Dkt Ojukwu kwuru na akwara ahụ ka nwaanyị ọbụla kwesiri ime ka o sie ike site na ime ụfọdụ mmegharị ahụ dị icheiche ga-enweta ya ka o wee jikọta ya ahụ mana kọsetị ga-eme ka ọ yọọ ayọ.

Nwaanyị mụrụ nwa nwere ụfọdụ mmegharị ahụ o kwesịrị ime maka afọ ya kpọmkwem iji mechie oghere dị ya n'afọ nke afọ ime butere tupu o nweeike imebe ụdị ndị ọzọ.

Otu onye na-achọghị ka a kpọpụta aha ya BBC Igbo gwara okwu kwuru na ya nwere ọtụtụ nsogbu n'afọ ya maka na ya na-eyi kọsetị.

O kwuru na ya rie nri, afọ ya anaghị ezu ike, ọsịsọ ga na-asọ ya, eriri afọ ya ga na-atụgharị ya.

Oge ya gara ụlọọgwụ, dọkịnta agwa ya kwụsị iyi ya, oge ya kwụsịrị ya ka ya malitere inweta onwe ya, nke ahụ mere ya anaghị eyizi ya.

Onye ọzọ bụ Gloria Orji-Emodi kwuru na ọ bụ etu ka onye mma ka ọ ga-eme.

O kwuru na kọsetị nyere ya aka oge ya mụchara nwa iji weghachite afọ ya.

O kwukwara na ọ bụ dọkịnta ya gwara ya ka ọ na-eyi ya ma o nwebeghi ihe ọbụla mere ya site na ya.

Onye ọzọ bụ onye na-emgharị ahụ nke ọma bụ Nneoma Ihenacho kwuru na kọsetị anaghị ata abụba afọ cha cha, kama ọ ga-eme akwara afọ ayọọ ayọ maka na oge ị na-emegharị ahụ, kama ime ka akwara ndị ahụ gbasie ike, kọseti ejide ha, ihe ị na-eme agaghị eru ha.

Mana n'ihe niile a, dkt Ojukwu kwuru na ihe ndị so ya ka uru ọ na-enye ma dọọ aka na ntị ka nwaanyị jisie ike jiri imegharị ahụ hazie akwara afọ karịa iyi kọsetị.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: