You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Godswill Akpabio: Gbajabiamila enyela Akpabio abalị abụọ iji kpọpụta aha ndị omeiwu NDDC nyere ọrụ ngo
Onyeisi Ụlọomeiwu Nta bụ Femi Gbajabiamila enyeela Senetọ Godswill Akpabio iwu ka ọ wepụta aha ndị omeiwu naara NDDC ọrụ ngo.
Nke a na-eme dịka Akpabio nọrọ n'ihu otu ụlọomeiwu hibere maka inyocha nrụrụaka na NDDC kwuo n'ọtụtụ ọrụ a na-ebo ebubo na e mefuru ego na ya bụ ndị omeiwu ka e nyere ya n'ọrụ ngo.
Godswill Akpabio bụbu aka na-achị steeti Akwa Ibom ma bụrụ minista na-ahụ maka Naịja Delta ugbua zara okwu ndị kọmitii ndị omeiwu nta Naịjirịa hibere maka mpụ na nrụrụaka.
Ha na-enyo mpụ na nrụrụaka mere n'ụlọọrụ ọ dịmma Naịja Delta Bekee kpọrọ "Niger Delta Development Commission" (NDDC) n'ụbọchị Monde bụ nke 20 n'ọnwa Jụlaị 2020.
Dịka ya bụ mkparịtaụka malitere n'ọnụdụ ịcha ọkụ nke kpatara onyeisi NDDC bụ Danile Pondie ịchị ume ọkụ ka ojuru ya isi, ọtụtụ mmadụ nwere olieanya na nke Akpabio ga-achịkwa ọkụ n'ọnụ.
Akpabio malitere okwu ya site n'ịgwa ndị kọmịtii omeiwu na onye bụbu onyeisi ha wezụgara onwe ya na nyocha a kwesiri ime etu ahụ kemgbe.
Ọ sị: "E be anyị nọ abụghị ebe ekwesiri iyi mmadụ egwu."
Ọ gakwara n'ihu si na dịka enyere ndị bịara bo ya ebubo ihe ruru elekere anọ ikwu okwu, na ọ ga-adị mma ka enyekwuo ya ohere ịzara ọnụ ya banyere ebubo ndị a eboro ya.
Mana, tupu ọ gaa n'ihu kwuwe ihe ọchọrọ ikwu, ndị omeiwu doro ya anya na ihe ha na-eme abughị iji kparịa onye ọbụla mana okwu dagharịrị ka ha kwuchere nke a.
Akpabio sị na ihe mere ọrụ ya na nzute ya na ndị omeiwu jiri di mkpa bụ na ọ dị ya n'obi ihu na ihe gara na Naịja Delta ọfụma.
Ọ sị; "ka anyị nọ ebe a, eji ụmụakwụkwọ Naịja Delta na-agụ akwụkwọ na ofesi ụgwọ akwụkwọ ha."
'Emetụghị m ego aka'
Akpabio gbadosi ụkwụ n'ala na-ekwu na aka ya adịghị na nrụrụaka ma kwukwa na ha emetụghị ego NDDC aka.
Mana, o kwenyere na ya binyere aka n'ikenye ndị ọrụngo ọrụ site n'ogige NDDC.
Ọ sị, "otu ihe m binyere aka metụtara ịzu ụgbọala. Ndị NDDC na-ebute ụgbọala ha ji arụ ọrụ n'ọnụ puku narị naira abụọ kwa ụbọchị. A gbara m mbọ ịkwụsị ya. Ugbua onyeisiala nyere anyị ikike igoro NDDC ụgbọla 90."
Onweghi onye achụrụ n'ọrụ aka m dị na ya
Akpabio sị na ebubo na ya chụrụ ndị mmadụ n'ọrụ abụghị eziokwu.
Ọ sị na ọ bụghị ihe niile na-eme na ngalaba ahụ ka ya ma maka ya, ọkachasị ebe o si metụta ịchu ndi mmadu n'ọrụ.
Ọ sịkwa na ndị niile na-arụ ọrụ na NDDC nwetere ihe enyemaka banyere coronavirus.
"Ndị ọrụ nọ ezumike nwetere ihe ekere n'atumatụ "covid relief."
Onweghi oge m si onye ọbula ṅụọ iyi
Otu ebubo Joi Nunieh bu onye bụbụ onyeisi NDDC boro Akpabio bụ na ọ sị ya ṅụọ iyi na ọ ga-erubere ya isi.
Mana Akpabio si na onweghị oge nke a mere ma nacha.
Ọ sị; "Nzukọ niile anyi na Nunieh nwere bụ maka ọrụ."
Ebubo ọzọ Nunieh boro bụ na Akpabio nwere olileanya ịzọ ọkwa onyeisiala mana ọ sị na nke ahụ abụghi eziokwu: "Enweghi m olileanaya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa."
A na-ekeri ọrụ NDDC nye ọtụtụ mmadụ
Akpabio sị na otu ihe a na-eme na NDDC na enye ohere mpụ bụ ikeri ọrụ nye ya ọtụtụ mmadụ.
"Otu ọrụ, enye ya ọtụtụ ụlọ ọrụ. Nke na-eme ka eke nde naịra 49 ọtụtụ mgbe n'otu ụbọchị."
Akpabio si na a na-eme nke a iji gbanarụ iwu sị na minista ga-ebinyeriri aka tupu emefuo ego gbagotere.
"E were nde 49 nye onye a, e were nye onye nke ọzọ, tupu chi ejie, agbariela ijeri naịra iri abụọ na atọ, bụ ego m kwesiri ibinye aka tupu agbarie."
Okwu o kwuru maka Tunji Ojo
Akpabio kwugharịrị okwu okwuru banyere onyeisi ndi omeiwu a na-eme ya nyocha bụ Tunji Ojo.
Ọrụ enyere na mpaghara Ore abụghị Tunji Ojo ka enyere ya. A na m eweghachi okwu ahụ. Ya bụrụ na ndị mmadụ ghọtaghị m ihe m kwuru
Na ngwụcha Akpabio si na NDDC ga-agbanweriri, ma si na ọ bụ ya mere ya jiri na-enwe ọṅụ na enyere ya ohere ị bụ minista Naịja Delta.
Tunji Ojo n'onwe ya wezụgara onwe ya na mkparịtaụka ahụ dịka ọ sị na ọ chọrọ inye onye ọbụla ohere ikwu uche ya na atụghị egwu.
Daniel Pondie boro Maazi Ojo ebubo na aka ya dị na nrụrụaka NDDC.
Ọ bụ ndị omeiwu kachasị irite uru ọru NDDC na-enye
Akpabio kụwara ihe yiri akị oyibo nsụgbe oge o kwuru na ndị omeiwu Naịjirịa so na ndị kakasị irite uru n'ọrụ NDDC na-enye dịka ihe ruru pacenti 60 bụ n'aka ha ka ọ na-aga.
"Anyị nwere akaebe gosiri na ọ bụ ndị omeiwu NAAIJỊRỊA kacha erite uru NDDc site n'inwete ọrụ ngalaba ahụ na-enye."
Ka ogbuwara akị a, ọ bịara dị achọghị ka okwucha ihe ọ chọrọ ikwu dịka otu onye omeiwu si ya wete akaebe.
Biko nu, zọọ nụ m
Otu nwaanyị sọsọ so ndị omeiwu na-enycha NDDC chara Akpabio ụdịrị ọkụ mere ka ọchọwa onye zọpụta.
O tiri mkpu: "Biko zụọ nu m o, nwanne m nwaanyị chọrọ iri m na ndụ.
Ịbịara ebe a imeghari Naịiria anya
Otu onye omeiwu chanyekwara Akpabio ọkụ site n'ịgwa ya na o jighi eziokwu bịa.
Ọ sị: "Ihe ị bịara ebe a ime bụ imegharị ndị Naijirịa anya. Ị chọghị ikwu etu aka gị siri banye n'ihe mere, maọbụ kwete na inweghi ikike ime ihe i mere."
Enweghi ike izu ego NDDC makana ọ dị na CBN
Dịka ọ na-akọwa na o nweghi ike izu ego NDDC makana ọ bụ n'ụlọ akụ Naịjirịa bụ nke Bekee kpọrọ "Central Bank of Nigeria" (CBN) ka ego ha dị.
"Ọ dị mfe ịchọpụ ego banyere na ego pụrụ site n'atụmatụ onyeisiala Buahri hibere ka a na-etinye ego gọọọmentị ọbụla na CBN."
Akpabio kwuru nke n'ịza ebubo na o zuru nde naịra 40,0000 n'akpa ego NDDC.
Ọ sị: "Unu mee nyocha, unu ga-ahụ ebe ego a nille bara na ihe eji ya mee."
Ihe ndi ọzọ o kwuru:
- A manyere m aka n'ọrụ NDDC maka na ego ha chọrọ iji mee ihe adịghị na bọjeti.
- Akwụkwọ ewepuru na NDDC dị n'aka ndị na-eme nyocha
- Amaghi m na onwere ọrụ enyere ka eji kpochaa awarawa mmiri
- Enwere m akwụkwọ gosiri na-ewepuru ijeri Naịjirịa abụọ n'otu ụbọchị
- A ga m achọ enyemaka ndị omeiwu ịkwusị atụmatụ mgburi ọrụ na NDDC (nke a bụ inye ọtụtụ ụlọ ọrụ otu ọrụ)
- Onye bụ Minista kwesiri ịma etu NDDC si agbari ego, makana ya bụrụ na ọ maghị, ọgaghi ekwunwu ihe na-eme ebe ahụ
- Onyeisiala nwere ikike iwe ndị mmadu n'ọrụ na nwa mgbenta. Ọ bụghị taa ka ihibe "interim managment Committe' (IMC) malitere
- O bụ maka nyocha ka onyeisiala jiri hibe IMC
- Amaghị m ego ole IMC kwụrụ maka nyocha. Mụọ onwe m chọrọ ịmata
- Ọ bụghị m ka ọ dịrị ibinye aka ka ndị NDDC goo ihe maọbụ nye ọrụ.