You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Izu Madubueze: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka okwu okorọbịa a
Akụkọ na-ewu ọkụ ugbua bụ akụkọ pụtara gbasara otu okorọbịa echere na o gburu onwe ya maka ebubo ụgha.
Dịka ọ dị ugbua, akụkọ si na nke mbụ pụta bụ na ọ bụ n'ihi ebubo mwakpo ụgha ka o ji were ndụ ya.
Ndị enyi ya bu iwe n'obi were depụta akụkọ a na-ekwu na oge eruola a ga-achọ ihe e mere onye ọbụla boro mmadụ ebubo mwakpo ụgha.
Ha malitere #JusticeforIzu iji kwupụta na ekwesiri inye Izuchukwu ikpe ziri ezi ma n'ọnwụ.
Ugwunna Ejikem kwuru na a ga na-eme ndị boro ndị mmadụ ebubo mwakpo ụgha, otu ihe a na-eme ndị mere mmadụ mwakpo
Zaddy Clinton na-ekwu na nwaanyị ọbụla boro mmadụ ebubo mwakpo ụgha kwesịrị ị ga ụlọ mkpọrọ
Isheunife na-ekwu na ọ bụ naanị n'ihi na ọ jụrụ nwaanyị ahụ ọyị ka o ji boo ya ebubo a were ndụ ya
Otu onye ma Izuchukwu achọghị ka akpọọ aha ya gwara BBC n'ozi ekwentị na nke a mere n'ezie nakwa na o na-ewute ha nke ukwu.
O kwukwara na ọ bụ na mba Amerịka ebe nwa okorọbịa ahụ bi ka akụkọ a mere.
Iwu mba Amerịka nyere ohere ka onye ọbụla eboro ebubo ụgha kpụpụ onye boro ya ebubo ahụ ụlọikpe.