You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
250 Account Probe: Gọọmentị Imo na-akpa agwa ụmụaka ọtaakara - Rochas Okorocha
Ndị ụlọomeiwu Imo steeti enyela ikike ka enyocha akara ọba ego narị abụọ na iri ise emepere mgbe Rochas Okorocha bụ Gọvanọ Imo steeti.
N'aka nke ọzọ, lekwa ihe Rochas Okorocha nwere ikwu maka nyocha Gọọmenti Imo steeti na-enyocha ya.
Onyeomeiwu Imo steeti bụ Uche Ogbuagu kwuru na nyocha a bụ ka achịkọtaa ọba akụ ndị a ka ha bụrụ otu.
Ihe nke a pụtara bụ na ha ga enyocha ọba ego ndia niile ka ha mara nke ego dị ma nke ego na adịghi.
Ogbuagu kwuru na mgbe ha mechara ka ha ga-achịkọta ọba ego ndị a n'ihe ndị bekee na-akpọ 'Single Treasury account'.
Ndị omeiwu a rịọrọ ka ndị Ụlọakụ nwe oba egoi ndị a nyere aka ka atụmatụ a gaa nke ọma.