Bobrisky: Ọ lụrụ ọgụ ka nwoke ka-e suru ụgbọala ya?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye a ma ama maka iyi efe ma na-etecha ntecha ụmụnwaanyị bụ Bobrisky egosila ihe o ji bụrụ dimkpa site n'ịlụsa nwoke suru ụgbọala ya ọgụ.

Bobrisky, onye ezigbo aha ya bụ Idris Olarenwaju, depụtara n'akara Twitter ya na ya gakwaara onwe ya ọgbakọ mgbe nwoke ahụ ji ụgbọala ya suo nke ya.

Mana Idris kwuru na okwu bidoro mgbe nwoke ahụ bidoro mawa ya aka n'ihu jụwa ihe ọ pụrụ ime ya.

O kwuru na o mesiri nwoke ahụ ike ma gosi ya na ọ bụghị ya ka a na-amara aka.

Gụọ ihe o dere n'uju ebe a.

Nwoke ahụ agbarala ọsọ rịọ Bobrisky mgbahara.

Ụmụ mmadụ na-ekwu ọtụtụ ihe maka ihe mere na soshal midia.

@Blessyn_coco kwuru na isi ndo ezughi.

@Haryordeylaymi kwuru na ihe a gbagọjuru ya anya.

Bobrisky bụbu nwoke mana ọ na-ekwusi ike na ya bụzi nwanyị ugbua.

Akụkọ ndị ga-amasị gị