You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Uche Ogbodo: Ahụla m nkeọma na nke ọjọọ
Ụbọchị ncheta ọmụmụ mmadụ na-abụkarị ọpụrụiche mana amaghị m ihe ndị mmadụ ji kpụrụzie nke onye na-eme ihe nkiri bụ Uche Ogbodo n'ọnụ.
N'iji ịcheta ụbọchị ọmụmụ ya, Ogbodo were foto o sere ebe ọ gba ọtọ tinye n'elu soshal midia.
O jikwa ohere a depụta ihe niile ọ gabigagoro ma ja onwe ya ike na ọ bụ nwaanyị siri ajọ ike.
Ndị mmadụ agbaghị ya nkịtị maọlị. Lekwa ihe ha depụatara.
@Areafada1 jụrụ ihe ndị mmadụ ji etụfụ ụra maka ọtọ Uche, ọ bụ na ha amaghị na ọ bụ onye na-eme ihe nkiri?
@EsterOnyinye okwuru na aọ bụghị ihe mghbagọjụ anya makana o teela ọtụwara anya agwa a n'aka Uche.
@dharmeelollar kwuru na ọ bụ ọrụ ise foto ka ọ ga na-arụzị.
Cheta na Ogbodo rịọrọ ka iwu Naịjirịa kwado ịgba akwụna n'oge gara aga.