You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu State: Lee ihe akụ ọnatarachi juputara n'Enugu State
- Onye dere ya, Chukwunaeme Obiejesi
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
A ma Enugwu Steeti ama dịka isi obodo mpaghara ọwụwa anyanwụ Niajiria.
Otu ihe akụ ọnatarachi e ji mara Enugwu bụ 'coal'.
N'oge mbụ 'coal' nke e si n'Enugwu egwupụta so n'otu ihe na-enye Naịjirịa nnukwu ego.
Mana ọbụghị sọ 'coal' bụ ihe akụ ọnatarachi dị n'Enugwu.
Lee ndị ọzọ dịka ngalaba dịka 'Raw Materials Research & Development Council' si depụta.
1) Coal
Coal bụ unyi pụrụ iche e si' nala egwupụta.
E ji ya emepụta ọkụ latrik, jirikwa ya akwọ ụgbọ okporoigwe Bekee kpọrọ 'train'.
'Coal' bụ ihe e ji mara Enugwu steeti, nke mere e ji akpọ ya 'Coal city'.
N'Enugwu North na South ka 'Coal bara ụba.
2) Gypsum
Gypsum bụ ụdị nkume dị nro e si n'ala egwupụta.
Ọ naghị esicha ike ka nkume ndị ọzọ.
Ihe e ji ya arụpụta dị ụbara.
Ha gụnyere nzu bekee a kpọrọ 'chalk', ọgwụ, nakwa 'Plaster of Paris' (POP).
E jikwa ya eme ka ala dị mma maka ịkọ ihe.
Na mpaghara Ezeagu ka e nwere 'gypsum' nke ọma.
3) Iron-Ore
'Iron ore' bụ ihe dị ka nkume e si n'ala egwuputa nke e ji emepụta igwe na ihe ndị ọzọ.
Ọbụ 'Iron ore' ka e ji arụpụta rọọdụ e ji arụ ụlọ nakwa igwe e ji arụ akwa mmiri nke Bekee kpọrọ 'steel'.
Onye gaa na akụkụ Udi, Igboeze North nakwa South, ebe ahụ ka 'Iron ore' jupụtara.
4) Glass Sand
Nke a bụ aja pụrụ iche nke e nwere ike ịgbaze iji mepụta 'glass'.
Ihe e ji 'glass' arụpụta karịrị akarị.
Nke a mere ka 'glass sand' bụrụ akụ ọnatarachi pụrụ iche.
Na Udi nakwa Uzo-Uwanị ka ị ga-ahụ 'glass sand' n'uju.
5) Silica Sand
'Silica sand' bụ aja pụrụ iche na-egbuke egbuke nke e ji eme ka ụlọ sie ike.
O sokwa na akụrụngwa e ji emepụta 'cement'.
Ahịa 'silica sand' na mba ụwa niile ruru ijeri dọla asaa na ụma anọ n'afọ 2018.
A na-atụ anya na ọ ga-eru ijeri dọla iri na ụma ise n'afọ 2024.
Ebe a ga-ahụ 'silica sand' bụ na Enugwu South, Igboeze North na South na Isiuzo.
6) Laterite
Ihe e ji 'laterite' emepụta dị ọtụtụ.
Ha gụnyere ịrụ ụzọ nakwa ịkpụ ihe ọkpụkpụ.
Na mpaghara Awgu, na Igboeze North na South ka e nwere 'laterite' kasị mma n'Enugwu.
7) Pyrite
'Pyrite' bụ igwe na-egbuke egbuke.
Ndị ọkacha mara na-ekwu na ebe ọbụla a hụrụ 'Pyrite', ọlaedo nwere ike ịdịkwa ebe ahụ.
Ọbụkwa kịrịkịrị ọlaedo ahụ na-adị n'ime 'pyrite' mere o ji ada oke ọnụ ahịa.
E ji ya emepụta mgbaolu, mgbaaka, naọla ndị ọzọ e ji acọ mma.
'Pyrite' dị nke ọma na mpaghara ụfọdụ n'Enugwu South.
8) 'Ball Clay'
Ụdị aja ụrọ a na-ama mma n'anya n'ihi ọcha ya.
'Ball clay' bụkwa otu akụrụngwa e ji emepụta 'ceramics'.
Mpaghara e nwere 'ball clay' nke ọma bụ na okpuru ọchịchị Isi Uzo.
9) Copper
'Copper' bụ ụdị igwe pụrụ iche.
A na-agụkọ ọla edo, ọla ọcha na 'copper' ọnụ.
Uru 'copper' bara dị ọtụtụ.
Agwakọọ 'copper' na 'aluminium' maọbụ 'zinc', ihe a ga-enweta bụ 'bronze'.
Nkanu East na West bụ ebe e nwere 'copper'.
10) Ndị ọzọ
Enugwu bụkwa obodo na-emepụta nri nke ọma.
Ha nwekwara ihe nlere anya dị iche iche dịka ọgba, ugwu, ọdịda mmiri nke Bekee kpọrọ 'water fall'.
N'otu aka ahụ kwa, mmepụta ejije bụkwa ihe ọzọ e ji mara Enugwu.
Ọbụ ebe ahụ ka a na-anọ emepụta ọtụtụ ihe ejije 'Nollywood'.
Ọ bụrụ na gọọmentị etit nakwa nke steeti elebaa ihe ndị a anya, Enugwu ga-abụ ụwa bịa lelee.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: