You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Big Brother Naija Season 5: Ihe ndị mmadụ kpụ n'ọnụ n'ụbọchị mbụ ọ malitere
Dịka a malitere Big Brother Naija nke agba ise a kpọrọ "Lockdown", e nwere ike ndị nọ n'ime ụlọ ahụ amaghị na ha emetela ihe ndị ha ji ewu n'elu soshal midia.
Dịka ha batachara ma kwuputechaa aha ha na ihe e ji mara ha gụnyere ụdịrị ihe ha chọrọ na nwoke maọbụ nwaanyị ha na-ayị, ha kwukwara ụdịrị ihe ha na-atụ anya ga-eme mgbe ụbọchị 71 ha ga-anọ n'ime ga-abịacha laa.
Ndị dị ka Laycon bụ otiegwu, Dorathy, Nengi, nakwa Ozo, ka ndị mmadụ kpụ n'ọnụ kemgbe ha tụrụ ụkwụ n'ime ụlọ ahụ.
Ihe mere ha ji ewu:
1) Laycon:
Site n'oge o yi uwe na-enwu ọkụ pụta n'ebe Ebuka Obi-Uchendu bụ onye nchịkọta ya bụ emume na-anabata ya, ruo ka o kwuru na ịkpa maka mmekọ nwoke na nwaanyị masịrị ya, ọtụtụ ndị mmadụ gụfuru ya.
Ha sị na enweghi ihe ọ chị, ụfọdụ che na o kweghi ekwu okwu n'ihi na "ọ maghị asụ Bekee", ebe ndị ọzọ kwuru na ọ bụ maka na ọ hụtara onwe ya ka onye ndị ọzọ karịrị, mere o ji gbachi nkịtị na-ele sọsọ anya.
Mana ka Laycon bụ otiegwu chọrọ iji ohere a kwalite egwu ya mepere ọnụ gụọ otu egwu ya, ọtụtụ ndị mmadụ echigharịala ma kwuo na ha ga-akwado ya.
Ụfọdụ ndị otiegwu a ma ama gụnyere Reminisce, Sean Tizzle, Chinko Ekun, Oxlade adọnyekwarala ya ukwu.
2) Dorathy:
Dorathy mere ka ọtụtụ ndị chefutu ọzụzụ nne na nna ha zụrụ ha site n'oge o zutere Ebuka, ma ruo oge ọ banyere n'ime ụlọ.
Gịnị ka ha ji kpụrụ ya n'ọnụ? Ha hụrụ ara ya ma na-eti mkpu na o juru ebe niile, ọ bịara dịka ara ya o nweela ndụ nke naanị ya.
Ọtụtụ ndị ọkachasị ụmụnwoke, kwuru sị na ha ga na-akwado ya n'ihi otu ihe a.
3) Nengi:
Nengi ma na ọ mara mma tupu ọ bata n'ụlọ, mana ọ maghị na ọ bụghị mma ya ga-eme ka ndị mmadụ kpụrụgodi aha ya n'ọnụ.
Dịka Dorathy, ukwu Nengi enweela ndụ nke ya, dịka ndị mmadụ na-ekwu na ihe o bu n'ukwu bụ 'ebelebe'.
Ihe ọzọ mere o ji ewu bụ na ndị mmadụ na-ekwu na ọ na-atụ asị na ọ dị afọ 20 n'afọ a n'agbanyeghi na ọ sị na o so mee asọmpi maka nwaanyị kacha maa mma na Naịjiria n'afọ 2017.
4) Ozo:
Ozo malitere iwu dịka ndị mmadụ na-ekwu na ọ mara ezigbo mma nwoke.
Ndị mmadụ na-ekwu na Ozo nke ezigbo aha ya bụ Ozoemena ma na ọ mara mma, ma bụrụ onye ga-etinye obi ọtụtụ ụmụnwaanyị na nsogbu.
Ihe ise gbanwere maka Big Brother Naija nke 2020
Big Brother Naija agba nke ise ga-amalite taa n'elekere asaa nke abalịMana ọrịa coronavirus emeela ka ụfọdụ ihe gbanwe gbasara ya bụ ejije.
Onye ga-achịkọta ndị ga-eso na BBNaija nke 2020 ka bụkwa Ebuka Obi- Uchendu.Lee ihe ise ga-agbanwe na nke afọ a1.Ndị ọbia agaghị abatali n'ụlọ ebe a na-eme ya bụ ihe nkiri2. Ndị na-ekiri ha agaghị abịali n'ụlo ebe a na-eme ngosi ogo mwepụ na BBNaija3. A ga na-enyocha mkpọmọkụ ahụ onye ọbụla so eme ihe nkiri a kwa ụbọchị
4. A ga-eji disinfectant ehicha ebe ọbụla n'ime ụlọ ahụ tupu amalite mmepụta ihe nkiri mgbe ọbụla.
5. Ndị ọrụ ahụike ga-anọ ikwado ndị na-eme ya bụ ihe nkiri.
Ihe nrite ga-eso ndị meriri na Big Brother Naija 2020
Ọtụtụ ihe bụ nke gbanwere maka Big Brother Naija nke afọ 2020, site na nhọpụta ndị ga-esonye e mere n'elu intaneti rakwa ihe nrite so ya.
Onye ga-emeri agba nke ise a ga-eji ihe nrite ọnụ ego ya ruru nde naira iri asatọ na ise.
Lee ka e si gbarie ya:
- Nde naira iri atọ bụ ego e ji n'aka, nakwa ụlọ obibi ọnụ ụlọ abụọ
- Ụgbọala ukwu nke Innoson
- Njem nleta na mba Dubai nakwa Dublin
- Njem ị ga kiri asọmpi agba ikpeazụ nke UEFA champions League
- Ihe e ji bi n'ụlọ
- A ga na-ebunye ya Indomie , Munch it chin chin nakwa ihe eji taa atụ Cogate ruo otu afọ
- A ga-ebunye ya Pepsi ruo otu afọ
- Ihe njụoyi
- Ekwenti
Ndị hibere emume a kwuru na ha e nyochala ndị niile ga-eso me ya bụ ejije, dopu ha ruo izu ụka abụọ tupu a nabata ha n'ime ụlọ ahụ ebe a ga-eme ejije ahụ.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia
@KhamisAbdulrauf kwuru na ndị a họpụtara maka mmemme a na-enye ya obi ụtọ
@ukwuchisom na-ekwu ya bụrụ na ahọpụtara ndị ọhụrụ a ọfụma makana ọ chọrọ ka agba nke 2020 kajaa akaja.
Ụwa nwezikwa nkiri!