'N-Power ji ndị rụrụ ọrụ oge mmachi coronavirus ụgwọ ọnwa anọ' - Onye ọrụ N-Power

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka gọọmentị mepere websaịt ha ka ndị mmadụ tinye aha ha, ọtụtụ ndị ọrụ N-Power na-ekwu na a kwụbeghi ha ụgwọọnwa anọ e ji ha.

Otu onye ọrụ ndị N-Power na-achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara sị "e ji ihe karịrị mmadụ puku iri asatọ ụgwọọnwa ọnwa anọ nke bidoro kamgbe ọnwa Maachị".

Onye ọrụ a kọwara na ọ bụ site na nzukọ ndị ọrụ N-Power na Facebook na Whatsapp ka ndị e ji ụgwọ gụrụ onwe ha were gụta ihe karịrị mmadụ puku iri na asatọ e ji ụgwọ na steeti niile nọ na Naijirịa.

Ọ kọwara na ụfọdụ ndị ọrụ N-Power nọ na ngalaba N-Health, ndị rụrụ ọrụ ahụike oge a machiri ngagharị n'ihi coronavirus anatabeghị ụgwọọnwa kemgbe anọ.

Onye ọrụ a kọwara na mgbe ha gwara onyeisi N-Power bụ Salisu Na'inna Dambatta maka ụgwọ eji ha, ọ gwara ha na ngalaba N-Power gbanwere usoro ha ji akwụ ụgwọ, na ọ bụ ya mere na akwụghị ha ụgwọ, ka ha nwee ndidi.

Ọ kọwara na ọ bụ n'ọnwa Mee ka e kwuru na a ga-akwụ ha ụgwọ, kama otu abụghị n'ezie.

Onye ọrụ a kwukwara na ọ bụ mgbe ndị otu ha na onye ntaakụkọ kwuru okwu maka ụgwọ e ji ha ka a kwụrụ ndị ọrụ N-Power a na-akwụ N10,000 ụgwọ. Kama ndị nke nwere asambodo mahadum anatabeghị ụgwọọnwa ọnwa anọ.

Onye a kwukwara na mgbe ha kpeseara iwe ha n'akara Twitter ndị N-Power, ndị ụlọọrụ N-Power gwara ha ka ha zite aha ha na ihe ndị ọzọ, nke nyere ha olileanya na a ga-akwụ ha ụgwọ mana onweghi ihe ha hụrụ.

Ihe ndị N-Power kwuru

Mgbe BBC Igbo kpotụrụ Halima Oyelade bụ ọnụ na-ekwuchitere Minista na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ na Naịjirịa bụ Sadiya Umar Farouq, ọ kọwara na ndị otu dị iche iche na-elekọta N-Power nọ na nzukọ maka ya bụ ụgwo e ji.

Ọ kọwara na ọ ga-ezi ozi mgbe ha mechara nzukọ ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: