You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Lee ka Kate Anorue siri napụ ndị ọcha ya bụ ọkwa wee gosi na nwanyi bụ ihe
- Onye dere ya, Ebere Ekeopara & Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Reporter, Igbo Service
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Mayor Kate Anorue bụ onye Nanka dị n'Anambra Steeti meriri ndị ọcha nakwa ọtụtụ ụmụnwoke ya na ya zọrọ ochịchị n'Enfield ugboro abụọ.
Ọ bu ụzọ chia site n'afọ 2012 rụo afọ 2013 mana ọ chiri nke ọma nke mere ka ahọpụtakwa ya ọzọ dịka onye ọchịchi Enfield ọzọ.
Nanị ya bụ onyeisi ojii nke mbụ nọ n'oche ọchịchi a ugboro abụọ na mba Briten.
Oriaku Kate hapụrụ Naijiria gaa obodo Britain n'afọ 1985.
Ọ kọwara na nna ya kwesiri ike na nwaanyị ọbụla kwesiri igụ akwụkwọ dika umu nwoke nke mere na nna ya zụrụ ya na akwụkwọ nke ọma.
Ndị obodo ya bụ Nanka Chiri ya "Ada jere mba turu ugo " n'afọ 2008.
Ndị omeiwu Anambra Steeti kwanyere ya ugwu pụrụ iche site na ịmere ya nke bekee kpọrọ 'Valedictory Sitting' n'Awka.
Lee ozi ekele ezitere Kate Anorue oge ahọpụtara ya dịka Mayor Enfield.
Dịka Kaụnsul Enfield siri wepụta n'websait, Kate Anolue na ndị imeobi ya ga-anọ n'ọkwa ọchịchị ahụ afọ 2019/20.
Ka ọ dị ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ezi ozi ekele maka nturuugo ahụ.
Otu APC na London kelere ya maka ibulie aha Naijiria elu n'ofesi nakwa maka ịbụ nwaanyị isi ojii mbụ a ga-eme 'Mayor' na mba Briten.
@UchePOkoye sị na nwa afọ Anambra ọzọ etuterela Nigeria ugo na mba ofesi.
Ihe ndị ịmaghị maka Kate Anolue
1. Anolue bụ nwafọ Nanka n'Anambra steeti
2. Ọ bụ onye ọkaiwu ma bụrụ onye na-alụ ọgụ maka ikike dịrị ụmụnwaanyị na ụmụaka
3. 'Ada Jere mba turu ugo' bụkwa onye 'midwife' nwetarala ọtụtụ nzere na Naijiria nakwa na mba ofesi
4. Anolue gara ebido ụwa ya dịka onye nkuzi mana Agha Biafra bụ ihe kwụsịrị ọzụzụ ya dịka onye nkuzi na Teachers Training College.
5. Ọ bụ onye anaghị ahụ mmanya ọkụ ma sorokwa n'otu ndị kweneyere na anaghị edetụ mmanya ọkụ ire bido oge ọ dị afọ 18
6. Anolue arụbuola dịka 'Mayor' of Enfield n'afọ 2012/13
Akụkọ ga-amasi gị: