N-Power 2020: Ndị ntoroọbịa amakpuola ọbaozi a ịchọ ọrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọba ịntanetị ngalaba na-ewe ndị ntoroọbịa n'ọrụ nke nwamgbenta akpọrọ N-Power na-enwu ọkụ dịka puku kwa puku ndị ntoroọbịa malitere idenye aha ha iji soro na ndị nwereike ịnwete ọrụ.

Nke a na-abịa dịka N-Powere tiri mkpu na ụfọdụ mmadụ malitere idenye aha tupu ha emepee ụzọ.

N-Power dọrọ ndị ntoroọbịa aka na ntị na anaghị akwụ ụgwọ iji denye aha n'atụmatụ a.

Ọ bụ ka oji nkeji 45 gafee elekere 11 nke ụtụtụ n'ụbọchị Fraịde bụ Juun 26 ka ọba ndenye aha a mepere.

Ndị niile denyere aha tupu oge a ga-emegharị ya maka N-Power sị na ha anabataghị nke mbụ ha mere.

Ka ọ kwụ ugbua, ụmụ ntoroọbịa na-edenye aha aghara aghara, dịka ha na-egosi n'akara Twitter ha.

Mana dịka ụfọdụ na-ekwu na ha gafere njem idenye aha ha ọfụma, onwere ndị sị na ụkwụ kpọrọ ha n'ụzọ.

Ngalaba N-Power, site n'akara Twitter ha na-akọwa ma na adụ ọdụ etu ndị a ụkwụ kpọrọ ga-esi chọta ezigbote ụzọ ha ga-esi edenye aha ha.

Etu ndenye aha na N-Power a si ewu gosiri na ọtụtụ ntoroọbịa Naịjirịa chọrọ ịnwete ọrụ, nke gbara akaebe akụkọ na-ekwu na ndị gụchara mahadum enweghi ọrụ ka nkụ.

Ọ gịnị bụ N-Power?

Onyeisiala Muhammadu Buhari hibere N-Power n'afọ 2016 iji belata ụkpa na ụbịam, enweghị ọrụ nakwa nsogbu na-eso ha.

Atụmatụ a gunyere iwe puku kwa puku ndị enweghị ọrụ ma zinye ha ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọrụ ndị ọzọ ebe ha ga-arụ ọrụ.

Gọọmentị na-akwụ ndị a puku naịra iri atọ kwa ọnwa n'ime atụmatụ a.

Ogige gọọmentị atụmatụ a dabara bụ nke akpọrọ "Social Investment Programme".

A na-ele anya na ọ bụ ndị ntoroọbịa 400,000 ka a ga-enye ọrụ n'ọkpọ a.

Etu esi edenye aha na N-Power nke 2020

Ndị so na ọkpọ a akpọrọ "Batch C" ga-edenye aha ha n'ọba .

Ndị tozuru isonye n'ihe a bụ ndị di afọ 18 ruo 35.

N-Power kọwara etu esi eme ya na foto a.

Lee ihe onye chọrọ idenye aha kwesiri inwe

  • Akara ụlọ akụ gị nke Bekee kpọrọ "Bank Verification Number" (BVN)
  • Foto ọhụrụ nke Bekee kpọrọ "passport" dị na ụdịrị atụmatụ jpeg maọbụ PNG.
  • Akara email maọbụ nke ekwentị
  • Asambodo mahadum na nke NYSC.

Njirimara gọọmentị nabatara:

  • Njirimara eji aga ofesi Bekee kpọrọ "International passport"
  • Njirimara nke Naịjirịa Bekee kpọrọ "National ID" si n'aka NIMC
  • Akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala
  • Akwụkwọ eji atụ vootu.

Ndị N-Power na-achọ

Gọọmentị Naịjirịa sị na ọ bụ mmadụ 400,000 ka ha na-ele anya ịwe n'ọrụ na mpaghara dị iche iche gunyere ịkụzị nkụzi, ịrụ na ngalaba ọrụ ugbo, ịrụ na ngalaba na-ehibe ụlọ, ịrụ na mpaghara nka nakwa teknụzụ.

Kemgbe amalitere atụmatụ a na 2016, ndị gaferela na ya eruola 500,000.