You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwafor Orizu: Ị ma maka nwoke a si nga bụrụ onyeisi ụlọomeiwu?
Gịnị ka ị ma maka Nwafor Orizu si n'ịbụ onye a tụkpuru n'ụlọmkpọrọ bụrụ onyeisi n'Ụlọomeiwu Ukwu Naịjiria?
A gụwa ndị Igbo kpọrọ akpọ ma n'ọnwụ ma na ndụ ma a kpọpụtaghị aha Orizu, a gaa nyowe ma aka enwe ọ dị n'ofe.
Ọ bụrụ na ọ dị ndụ taa, Orizu gaara adị afọ otu narị na isii (106).
N'agbanyeghi na nna ya nwụrụ mgbe ọ na-erubeghi afọ iri (10), Orizu na nne ya gbara mbọ hụ na ọ pụtara mmadụ n'ụwa a.
Ya mere o ji bụrụ ma onye agụmakwụkwọ na-amasị, onye ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa ode akwụkwọ.
Lee ihe ndị ị kwesịrị ịma maka ya
- A mụrụ Ọkparaeze Akweke Abyssinia Nwafor Orizu n'afọ 1914 na Nnewi dị n'Anambara steeti
- Ọ bụ nwa nwoke nke ise nke Obi Nnewi bụ Igwe Orizu, Eze Ụgbonyamba nke mbụ na nwunye ya mụrụ
- Ọ gara ọtaakara na ụlọụka St. Thomas dị n'Otolo, Nnewi, gaa praịmarị n'Ụlọakwụkwọ Central dị n'Ọnịcha ma gakwaa Sekọndịrị na CMS Central dị na Nkwọ, Nnewi
- Na CMS Central ahụ ka ọ nọ malite ikuzi nkuzi
- O si ebe ahụ gaa Achimota Kọleji dị na mba Gana, tupu ọ gaa na Mahadum Lincoln, Mahadum Ohio Steeti, Mahadum Columbia nakwa Mahadum New York dịcha na mba Amerịka
- Na mahadum nke Ohio Steeti, ọ gụrụ Iwu Ọha na Gọọmentị, ebe ahụ ka ọ nọ mgbe o dere akwụkwọ mbụ ya bụ "Without Bitterness". O mechara dee ihe ruru akwụkwọ iri ọzọ na ndụ ya
- Aha otutu ya bụ "Orizontal"
- O mechara nwee ebe a na-ebiputa akwụkwọ nakwa ụgbọala e ji eme njem
- O hibere otu na-ahụ maka ụmụakwụkwọ si mpaghara Afrịka a kpọrọ African Students Association nakwa nke a kpọrọ American Council on African Education (ACAE). Ọrụ ACAE bụ maka ịchọta ohere ka ụfọdụ ndị si Afrịka gaa akwụkwọ n'efu.
- O tinyere ezigbo uchu n'ihe gbasara ịchụ nta ego a ga-eji zụọ ụmụ Naịjiria akwụkwọ n'Amerịka karịa na Briten, n'efu
- O so na ndị gara mgbaru n'Enugwu steeti n'ihi ọnwụ mmadụ 21 na-egwuputa unyi ndị ọcha gburu n'Iva Valley dị n'Enugwu, ma gosi nkwado ya.
- Mgbaru a ọ gara so butere ya nsogbu, n'ihi na dịka akụkọ si kwuo, ndị ọchịchị mba Briten ji n'ihi ya bo ya ebubo nrụrụaka n'ihe gbasara ego ACAE. E ji maka ya tụọ ya nga afọ asaa
- O so na ndị hụrụ na e hibere National Council of Nigeria and the Cameroons (NCNC)
- Ka ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị, o bu ụzọ bụrụ "chief whip" n'ụlọomeiwu ndị Ọwụwa-Anyanwụ, ebe ọ nọchitere anya ndị mpaghara Ọnịcha
- Ọ bụ onyeisi Ụlọomeiwu Ukwu nke atọ Naịjiria nwetara ka ha natachara nnwereonwe n'aka mba Briten n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, 1960
- Ọ nọrọ n'ọkwa ahụ site n'ọnwa Nọvemba 1963 ruo n'ọnwa Jenụwarị 1966
- O mechara bụrụ onye na-arụtu ọrụ dịka onyeisiala Naịjirịa, mgbe Nnamdi Azikiwe bụ onyeisiala mgba ahụ gawara mba ofesi.
- N'ọnọdụ a ka ọ nọ site n'ụbọchị 16 nke ọnwa Ọktoba 1965 ruo Jenụwarị 15, 1966, mgbe ndị agha ji ike weghara ọchịchị
- Ọ laghachiri Nnewi ka ọ pụrụ n'ọchịchị, ebe ọ gara tinye uchu n'ihe gbasara agụmakwụkwọ ọzọ
- Ọ nwụrụ n'afọ 1999, mgbe ọ dị afọ iri asatọ na ise (85)
Ihe ndị e ji echeta ya
A bara ụfọdụ ebe aha ya, ebe ndị ahụ bụkwanụ ihe ndị na-amarughi ya ụlọ ji echeta ya.
Ụfọdụ ihe ndị ahụ gụnyere:
- Mahadum pụrụiche maka ndị Nkuzi nke a na-akpọ Nwafor Orizu College of Education, Nsugbe, Anambara steeti
- E nwere Nwafor Orizu street n'Independence Layout dị n'Enugwu steeti
- E nwekwara ụzọ ya n'Apo dị n'Abuja
Ihe nkiri a ga-amasị gị: