You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nwaafọ Igbo Miracle Ikechukwu emeriela Big Brother Naija
Miracle Ikechukwu meriri ihe nkiri Big Brother Naija nke atọ, mere ka o nweta nde naịra iri abụọ na ise (25m).
Miracle nke onye ọbụla na-akpọ 'fly boy' nwetakwara ụgbọala 'ọkwụ ọtọ ekele eze' nke ruru nde naịra iri na abụọ (12m) nakwa njem n'efu nke ọ ga-akpọnwu mmadụ gaa ruru nde naịra anọ na puku narị asaa (4.7m).
O nwetakwara igwe eji akpọ egwu ruru nde naịra atọ (3m), nakwa nde naịra atọ na puku narị abụọ (3.2 million naira) bụ mgbakọ ego ndị o nwetara site n'ihe ndị onwetara n'asọmpi ndị o mere oge ọ nọ n'ime ụlọ ahụ.
Nwaamadi a bụ onye na-efe ụgbọelu nke bekee kpọrọ pilot, kwuru na ọ chọrọ iji ego a nweta asambodo ga-eme ka o nwee ike ị na-efe ụgbọelu nke na-ebu ndị njem nke bụ Commercial Pilot License (CPL) na bekee.
Ndị ọzọ ya na ha so rute n'ụbọchị ikpeazụ asọmpi ahụ; Cee-c nwetara pasentị iri abụọ na asatọ (28.04%), Tobi nwetara pasentị iri abụọ na abụọ (22.53%), Alex nwetara pasentị asaa (7.07%) ebe Nina nwetara pasentị anọ (4.18%).
Lee ka o si ṅụrịa ọṅụ ka a kpọrọ aha ya dịka onye mmeri.
Lee ebe o kelere ndị kwadoro ya ịhụ na o meriri.