Funke Oshonaike: E tiri m ihe ma wakpoo m n'ike

    • Onye dere ya, Juliet Mafua
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa in Lagos

ỊDỌ AKA NA NTỊ: WARNING: Akụkọ a nwere ebe ndị nwere ike irikasị gị ahụ.

"Oge niile m nụrụ akụkọ gbasara mwakpo, ọ na-akpọghachị n'ihe meburu m. Etiri m ihe ma wakpoo m n'ike. Ọ bụ ihe mere m."

Naịjiria na-etinye anya n'ihe gbasara ịwakpo nwaanyị n'ike nakwa etu e si akpaso nwaanyị agwa. Otu onye n'ime ndị na-ekwuputa ihe ha gabigara bụ Funke Oshonaike nweterela ihe nrite Olimpiks ugboro isii.

Oshonaike nwetakwarala ihe nrite ugboro atọ n'Afrịka, kwuru na ọ bụ Uwa Omozua, nwa dị afọ 22 a wakporo n'ike tupu e gbuo ya n'ụlọụka dị na Benin City Edo steeti, kpalitere mmụọ ya ikwuputa ihe ọ gabigara.

A hụrụ ozu Omozua ka a gbara ya ọtọ, n'ụlọụka ahụ - nke butere ọtụtụ ngagharịiwe na Naịjirịa, ebe ndị mmadụ na-ekwu na ha chọrọ ikpe ziri ezi.

Oshonaike kwuru na ihe mere Omozua kpalitere ihe ya na onwe ya gabigara mgbe a wakporo ya.

"Ọ bụbu enyi m - anya asabeghi m mgbe ahụ.

"Mgbe iwe were ya, o tiri m ihe. O were mkpịsị aka ya abụọ pido anya m, o wee dina m n'ike.

"Ike gwụrụ m, ọbara juchaa m n'ahụ.

"Amaghị m na a na-akpọ ya iwakpo n'ike. Naanị ihe m ma bụ na ọ bịara dị m ka atịtị juru m n'ahụ."

'O ji ji jide mma'

Oshonaike malitere ịpịa tenis oge ọ dị afọ 14, ka naanị afọ abụọ ọzọ gachara, o sonye otu Naịjirịa so gaa asọmpi All Africa Games nke afọ 1991.

Mana Olimpiks mbụ ọ gara bụ nke afọ 1996 - mgbe ahụ a malitela iwakpo ya n'ike.

"Anọ m na mahadum Legọs mgbe ahụ - M ga-ebu apa n'ahụ m niile wee gaa ụlọakwụkwọ, ndị mmadụ a na-ajụ ihe mere m.

"Mana enweghi m ike ịgwa mmadụ. Ọ dịka e mere m ọgwụ. Abụ m odibo n'aka ya."

Mwakpo a mere oge Oshonaike na-esokwa aga asọmpi ma na-emerikwa na Naịjirịa.

Mana n'agbanyeghi na anya ndị mmadụ nọ ebe ọ nọ, ọ hụrụ onwe ya n'ezigbo mkpagbu. Ebe o si ka njọ bụ na nwoke na-awakpo ya bịara na-ejide akụ ọ na-akpata.

Oge ọbụla ọ chọrọ ịpụ ma jụkwaa ese ego ya, e tie ya ezigbo ihe, merụọ ya ahụ.

O kwuru sị "Ọ sị m nye ya ego niile m kpatara.

"Oge ọbụla m chọrọ igbafu, m jụọ ya ese ego - mana ọ ga-ajụ iwepụta ya.

"Abụrụla m ọkaibe na Naịjirịa mgbe ahụ, mana obi akaghị m ịgwa onye ọbụla ihe na-eme. M ga-aga n'otu ebe gaa bee akwa. Ụfọdụ oge ọ dị m ka m gbuo onwe m."

Ịzọpụta isi ya

Oshonaike kwuru na obi mechara kaa ya ịzọ isi onwe ya, ọ mara na ọ baghị uru ịwụsa ọwa. Ọ chọrọ itinye uchu n'ịhụ na nrọ ọ na-arọ ịbụ ọkaibe na tenis mezuru.

"Nwoke a werechara ihe niile m kpatara, mana m gbara isi akwara hụ na m mechara kwụrụ n'ụkwụ m.

"Chukwu nọ na-edu m. Akụkọ Oprah Winfrey na Joyce Meyer so gbaa m ume hụ na gara n'ihu.

"Ebidokwara m ụwa n'isi ọzọ.”

Oshonaike bụ onye bu ma fee ọkọlọtọ ndị nọchitere anya Naịjiria n'asọmpi Olimpiks ikpeazụ e mere, nke Rio 2016, diri ihe ndị ọ gabigara kemgbe ọ hapụrụ onye na-awakpo ya.

“Ihe m gabigara ahapụghị m ozugbo, ọ metụtara ma aramara nakwa alụmdi na nwunye m."

"Aka m na-enweta onwe m ugbua.”

Oshonaike dị afọ 45 tara asaghị anya nakwa soshal midia ụta maka ụmụnwaanyị enweghi ohere ikwuputa ihe ha gabigara.

“Oge nke m anyị enweghi soshal midia, obi akaghị ụmụnwaanyị ikwuputa ihe ha na-agabiga.

"Aghọtaghị m ihe ọ na-eme m oge ahụ. Naanị nsonso a ka m ghọtara na ọ bụ mwakpo ka ọ na-awakpo m."

Oshonaike kwuru na ọ bụrụla onye ụmụnwaanyị e metọrọ na-elere anya. Ọ na-agba mbọ ịhụ na ụmụnwaanyị nwetere ikike ha ma kwụrụ n'ụkwụ ha ma ha gabigachaa ụdịrị ihe a.

"Ihe niile m gabigarala emeela m onye a na-elere anya. M na-akọnwuru ụmụnwaanyị ụdịrị ihe a mere akụkọ m dịka m na-agbakwa ha ume ka ha agbaghapụla onwe ha.

"Enwere m olileanya na ụmụnwaanyị ọzọ ka ga na-apụta na-ekwuputa ihe ha gabigara.

"Isi m pụtara."