You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Yemi Osinbajo Declares: O kwupụtala mmasị ịzọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023
Osote Onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo ekwupụtala uche ya ịzọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023.
O mere nke a site na mgbasaozi o wepụtara n'ụtụtụ Mọnde 11 Eprel, 2022, bụ nke o wepụtakwara n'akara twitter ya.
Osinbajo sị na o sorola Onyeisiala Muhammadu Buhari chịa ọchịchị afọ asaa ma nụkwa ụtọ ya, matakwa ihe niile ọ ga-ewe iji chịa ma chịta Naịjirịa.
Ọ sị na ọ na-eme nke a n'aha pati ya bụ All Progressive Congress (APC).
Kedụ nkwa Osinbajo kwere ndị Naịjirịa?
Osinbajo wepụtara ihe onyonyo ebe o kwupụtara mmasị ịzọ ọkwa ahụ ma kwee ndị Naịjirịa nkwa ihe ndị ọ ga-eme.
N'okwu ya, "site n'amara Chineke, ọ bụrụ ndị mmadụ ahọpụta m, ihe mbụ m ga-eme bụ ịrụcha ihe ndị anyị malitere, inwogharị ngalaba nchekwa, mezuo mgbanwe ngalaba ikpe ziri ezi, ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ ruru ha nakwa ịhụ na onye ọbụla nwetere ikpe ziri ezi."
Ọ sị na ọ ga-ewulite mmepe ngalaba dịka okporoụzọ, ọkụ latrik, ụgbọoloko, nakwa igwe nzirita ozi n'ịntanetị iji mee ka obodo dị mma maka azụmaahịa.
"Aga m eme enwogharị ngalaba ọrụ ugbo na Naịjirịa, hiwe tekinụzụ ga-enye ndị ntoroọbịa ọrụ ma wulite akụnaụba Naịjirịa.
Ihe ndị ọzọ banyere Osinbajo
- Ezigbo aha ya bụ Oluyemi Oluleke Osinbajo.
- A mụrụ ya n'ụbọchị 8 nke ọnwa Maachị afọ 1957 n'ime ezinaụlọ Opeoluwa na Olubisi Osinbajo.
- Ọ bụ onye Legọs Steetị.
- Ọ bụ onye ọkaiwu ma rụọ ọrụ dịka ọkaikpe gọọmentị Legọs Steetị site n'afọ 1999 ruo 2007.
- Ọ banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Pati All Progressive Congress ma bụrụ osote onyeisiala Naịjirịa kamgbe afọ 2015 rute ugbua.
- Ọ lụrụ nwunye ya bụ Dolapo Osinbajo n'afọ 1989 ha mụtara nwa bụ Fiyinfunoluwa Osinbajo.