Yemi Osinbajo: Ihe kpatara osote onyeisiala ji ewu na soshal midia

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Oche 'barber' bụ oche na-adịkarị ebe a na-akpụ isi.

Ọ bụ ụdị oche na-eme ntụgharị nke bụ n' ebe ọbụla onye na-akpụ isi tụgharịrị ya ka ọ na-eche ihu.

Ihe na-ewu ebe niile ugbua bụ na ọ bụ otu ahụ ka oche osote onyeisiala Naịjiria bụ Yemi Osinbajo dị ugbua.

Ụfọdụ sị na ọ bụ naanị aha ka Osibanjo na-aza dịka osote onyeisiala, na o nweghị ikike ọbụla nke aka ya.

Mana Ọgbakọ 'National Economic Council' e mere n'obi gọọmentị etiti n'ụbọchị Tọọzde bụ Osinbajo nọ n'isioche.

Ndị na-eso n'ọgbakọ NEC bụ ndị gọvanọ niile, onyeisi ụlọakụ etiti, nakwa ndị ọzọ welitere isi.

Nke a mere ka ndị mmadụ malitekwa tinyewe ọnụ n'okwu ahụ.

@onyebuchind gwara ndị asịrị ka ha mịba mma ha n'ọbọ.

@nnaji_kate sị ndị ọsụkọsụ nwamkpi ha dere jụụ.

Mana ụfọdụ ka na-ekwukwa na Osinbajo enweghịzi ikike ọbụla dịka osote onyeisiala.

@YoungOtutu kwuru na a napụla Osinbajọ ikike nile o jibu.

Mana ihe Young Otutu kwuru abụghị eziokwu n'ihi na Osinbajo ka jikwa ọkwa onyeisioche ngalaba niile ahụ ọ kpọrọ aha.

@BolanleCole kwukwara na Buhari agbapụla ndị niile nyeere ya aka ịbata n'ọchịchị n'ụzọ.

@dejiadeyanju kwuru na ihe nwere ike ịka njọ nye Onyeisiala.

Gịnị kpatara Osinbajo ji wube na 'Twitter'?

Ọ malitere mgbe ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ dere ọtụtụ akụkọ gbasara ọnọdụ osote onyeisiala.

Ufọdụ kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari nyere iwu ka Osinbajo nata ya ikike tupu ngalaba ọbụla ọ na-elekọta emee ihe ọbụla.

Ndị ọzọ kwuru na e nwere otu ndi ogwoogwo ọnụ a kpọrọ 'Cabal' na bekee ndị na-agbọ mbọ ịhụ ụzọ ha ga-esi kwatuo Osinbajo.

Otu jikọrọ ndị Yoruba kwukwara na onyeisiala emeela ka ọkwa osote onyeisiala bụrụ ihe ụmụaka ji egwuri egwu.

Ihe Osinbajo sara?

Laolu Akande bụ ọnụ na-ekwuru Osinbajo kwuru na ihe niile ndị ntaakụkọ na-ede gbasara Osinbajọ abụghị eziokwu.

Akande kọwara na ọbụghị ihe ọhụrụ na osote onyeisiala ga-anata onyeisiala ikike tupu o mee ụfọdụ ihe.

Mana ọdịghị ka ihe ndị a niile a na-emetụ Osinbajọ n'ahụ.

N'otu ọgbakọ ọ gara, o ji ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ede maka ya wee kpaa ndị mmadụ ọchị.

Ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ị na-ekwenye n'ihe ọbụla ha gụtara na sohal midia.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: