Electricity Generation: 'Ọ bụghị anyị ka enweghị ọkụ latrik si n'aka' - EEDC

Nsogbu enweghị ọkụ latrik na Naijirịa bu ihe gọọmentị Naijiria ka kpụ n'ọnụ ma na-achọ ebe mmiri siri banye n'akị oyibo.

N'izuụka Ọgọst 16, Osote Onyeisiala bụ Yemi Osinbajo were ebubo enweghị ọkụ latrik busa n'ụkwụ ụlọ ọrụ n'eke ọkụ latrik na Naịjirịa.

Osinbajọ kwụrụ nke a mgbe ọ gara igbape ọdọ ọkụ Latrik nke ndị Niger Delta Power Holding Company (NDPHC) rụrụ n'Abeokuta dị n'Ogun Steeti.

O kwuru na na-agbanyeghị na mkpurangwa gọọmentị nwere ugbua nwere ike imepụta ọkụ latrik nke ruru 8,000MW ma bupụ nke rụrụ 7,000MW, mana ihe na-ebe ka na-ebe.

Osinbajo kwuru na nsogbu sitere n'aka ndị ụlọ ọrụ na-ekasi ọkụ latrịk nye ọha mmadụ a na-akpọ Discos n'ihi na ngwa orụ ha agaghị ebulị ọkụ latrịk gọọmentị nwere ike ibupụta.

O kwuru na nke a mere ha na-ebupụta ọkụ latrik na-ebupụta nanị 4000MW nke ndị na-ekasa ya ga-ebunwu.

BBC gbara ndị Enugu Electricity Distribution Company (EEDC) ajụjụ maka nkea, ha sitere n'ọnụ Emeka Eze bụ onye na ekwuchitere ha were sị:

  • Ọ bụghị ndị na ekesa ọkụ nye ndị oha ka nsogbu sitere n'aka
  • Ozi anyị nwetere taa bụ na ike ọkụ latrik a na ebupụta bụ 4633.42MW
  • Anyi bụ EEDC na eketa nani ọkara 9% nke pụtara 417.01 MW nke anyị na ekesa nye ndị ọha nọ na-okpuru anyị
  • Ike ọkụ Latrik a anaghị ezu na agbanyeghi na ngwa oru anyị ga-ebu 1000MW
  • O bụghi eziokwu na gọọmenti na ebupụta 8000MW
  • Mgbe ọbụla ewelitere ike ọkụ latrịk, anyi bụ EEDC dị njikere ikesa ya bụ ọkụ Latrịk.

Kirie ihe ndị EEDC kwuru mbụ

Lee akuko ga-amasị gị