You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere m jiri kpọchie nwa nwanne nne m n'ụlọ nkịta - Onyinye Mbadike
Ndị uweojii nke Legọs steeti anwuchiela otu nwaanyị di afọ iri abụọ na anọ maka mmegbu o megburu nwanna ya dị afọ iri ma gbachie ya n'ụlo nkịta.
Ihe onyonyo a ekwughi mgbe ihe a mere kama ọ bụ n'ọnwa a ka ihe onyonyo a bidoro wuwe na 'Twitter'.
Ihe onyonyo a gosiri ebe nwata nwaanyị jị ajị ukwu a pịa nwata nwoke a ihe.
O mechara dọrọ nwantakịrị tie ya ihe ma gbachie ya n'ụlọ nkịta.
Nwa nwaanyị sị na nwanna ya a bụ Chibuike Eziamaka kpasuru ya iwe mgbe ọ ṅụchara mmanya ọkụ were jirị okwute mebie enyo ụgbọala ya.
Ihe onyonyo a kpaliri iwe ndị mmadụ nke ukwu nke mere ka ụfọdụ ekwe nkwa ego ka e wee nye onye ga-achọpụta onye nwaagbọghọbịa ahụ.
Ọ bụ na ụbọchị Tụzde ka ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Dolapo Badmus kwuru na Twitter na ha anuchiela nwaagbọghọbịa ahụ.
O dere sị, " Anyi anwuchiela onye echere na ọ bụ ya mere ihe a.. Nwata nwoke ahụ bụ nwa enweghi nne na nna.
Ọ nọ na nlekọta ndị gọomenti na Legos steeti."
Badmus na ekele ndị ọha mmadụ maka mbọ na enyemaka ha nyere nke ndị uweojii jiri nwuchie nwata nwaanyị a.
Lee akuko ga-amasị gị