You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Child Trafficking: Ichi egburu nwata a n'ihu zọrọ ya n'aka onye ntọrị
Ndị uweojii si ngalaba "Special Anti Robbery Squad (SARS) nwụchịrị otu nwaanyi aha ya bụ Queen Imoh ka ọ gara ịrị̄ nwatakịrị n'obodo Umuna nke Orlu, Imo steeti.
Queen Imoh, bụ onye uweojii si na ọ bụ onye mba Kameron, zutere nwata ahụ aha ya bụ Naziru Adbulwahab na mpaghara Nassarawa dị Kaduna, isi obodo Kaduna steeti.
Akwụkwọ ozi sị n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo bụ Godson Ikeokwu sị na ọ bụ ndị mmadụ hụrụ Imoh na nwata ahụ wee che na ọgaghị abụ nne ya gbaara ndị uweojii ama.
Ndị uweojii sị na Imoh kwenyere na ya zutere nwata ahụ aha ya bụ Naziru Abdulwahab ma kwukwa na ọbụghị mbụ ya kpara ụdịrị ike a.
Dịka ndị uweojii siri dee, Imoh gwara ha na ya rere nwa ya aha ya bụ Joseph Imoh dị afọ abụọ pụtụ naịra narị abụọ.
Ọ sịkwa na ya rere nwata aha ya bụ Samuel M dị otu afọ puku naira narị abụọ na iri atọ. Ọ sị na ya zuru nwata nke a mgbe nne ya si ya nedo ya anya.
Godson Ikeokwu dere na ọ bụ ndị Awụsa nọ n'Orlu nyere aka chọta nne na nna Naziru ma hụ na o ruru ha aka.
Imoh ka nọ n'aka ndi uweojii.
Ntọrị ụmụaka bụ ihe na-eme kwamgbe na Naịjịrịa, ọkachasị n'Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.
Lee ihe nkiri anyị maka ntọrị ụmụaka: