Babatunde Fashola sị na Naịjirịa na ayọrịbazi egwu maka ọkụ latrik

Minista na-ahụ maka ọkụ, ọrụ na ụlọ bụ Babatunde Fashola kwuru na ọkụ latrik a na-emepụta na Naịjirịa agbagotela ruo megawatt puku asaa.

Fashola kwuru nke a na Kalaba, isi obodo Kros Riva steeti ụnyaahụ.

Fashola nọ na Kalaba ebe ndị isi ọrụ na ngalaba ọ na-achị na-eme nzukọ.

O kwuru na agbanyeghi na ọrụ fọdụrụ ka nkụ, ngalaba ya agbanyela ọnọdụ ọkụ latrik na Naịjirịa karịa etu ọ dị mgbe ha malitere ọru n'afọ 2015.

"Afọ ato gara aga, akukọ bụ na mmepụta ọkụ latrik bụ nnukwu nsogbu anyị nwere na Naijirịa. Mgbe ahụ, ndị na-eke ọkụ na-ekwu na ha enweghị nke ha ga-ekenye ụmụ Naịjirịa.

"Mgbe ahụ, anyị na-eke "megawatt" 2,690 nye ndị Naịjirịa, mana akụkọ ahụ agbanwela. Ihe anyị nwere ike ugbua bụ megawat 5,222, nke bụ nke kachasị kamgbe Naịjirịa pụtara.

"Ugbua, ihe a na-emepụta bụ megawatt 7000, ma na-ekekwa 7000. Nsogbu ka dịkwa, mana anyi ga-ekwu na anyị na-aga n'ihu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: