You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Hope Uzodimma : Ihe mere na m akpọpụtaghị aha ndị na-akwado ndị ekperima n'Imo
Gọvanọ Hope Uzodimma nke Imo Steeti arịọla aka chịburu steeti ahụ bụ Rochas Okorocha ka ocnye ya ohere ka ya chie Imo steeti n'udo.
N'ọgbakọ ọ kpọrọ ndị ọrụ na-eru n'okwu na steeti ahụ ụbọchị Tuzde,Uzodimma rụtụrụ aka na o nweghi esomokwu dị n'etiti ha abụọ nọ mana ka o si kwuo 'Achọrọ m ka ọha mara na Rochas abụghịzị gọvanọ Imo steeti. Ya hapụ m aka ka m zaa gọvanọ ma chịa"
Uzodimma, onye kwuru na Rochas Okorocha abụghị aka mbụ chịrịla Imo steeti sịrị na na ndị ọzọ chichaa, ha achịlie aka elu.
Ọ gara n'ihu jụọ,"Gịnị mere ya bụ Rochas agaghị achịlị aka elu n'okwu ọchịchị Imo steeti."
O kwuru na Sịnetọ Okorocha bụ onye ọ tọrọ atọ nke bụ na ọ kwesiri ịna-akwanyere ya ugwu ruru ya.
Uzodimma rụtụrụ aka n'ebe nsogbo na ọgbaghara dị na steeti ahụ si bụ mgbe gọọmentị ya hibere otu ga-enyochapụta ma napụta ala na akụnaụba gọọmentị ụfọdụ ndị na-ekesa dịka ka ọtụtụ ọgbaghara malitere dapụtawa na steeti ahụ.
Okwu a na-abịa dịka o kwuburu na ọ ga-agba n'anwụ n'ọgbakọ ahụ ndị aka ha dị na ndị ntọ na oke ogbugbu mmadụ na Imo steeti.
Mana Ụzodimma bịara n'ọgbakọ kwuo na ọ gaghị agbazi aha ndị o kwuru na-akwado ndị ekperima n'anwụ sị, "E kpebiri m ka ndị ọrụ nchekwa mee nnyocha ma taa ndị aka ha dị na ya ahụhụ ruru ya."
Ọ sị na ọ bụ eziokwu na o kwere nkwa ịkpọ aha ndị a mana akụkọ malitere feghariwa na soshal midia butere ọtụtụ okwu nke mere o ji kpebie ịhapụrụ ya ndị ọrụ nchekwa.
O kwuru na ọgbaghara na-ada n'Imo steeti malitere mgbe ndị ntoroọbịa mere nghaghariịwe ma wakpoo ụlọ nga na ụlọ ndị uweojii nke mere ndị omekome ji pụta n'igwe akpa ike na steeti ha.
N'okwu mmepe obodo,Gọvanọ Uzodinma kwuru na gọọmentị ya na-agba mbọ ịhụ na Imo steeti mepere etu o kwesiri.
Ọ sị na ọ na-anabata ndị ojiegoachụego nakwa ndị ọrụ ndị ọzọ itinye aka kwado ọrụ ọma gọọmentị na-arụ.
O kwuwkara na o binyela aka bọjeetị 2022 maka ego a ga-eji rụọ ọrụ na steeti n'afọ ọhụrụ a.
O kwukwara na ahazịela etu ego si abata na ya bụ steeti Bekee na-akpọ "Internally Generated Revenue (IGR)" ma tinye Tekụnzụ nay a bụ nhazi.
O kwuru na ọ na-atụ ya na tupu afọ a agwụ, Ijeri naịra ise bụ ihe steeti ya ga na-emepụta
Ihe ụfọdụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu kwuru:
Nsogbu Imo bụ na ụfọdụ ndị chịarala amaghị na ha apụọla n'ọchịchị- George Obiozor
Maazị Obiozor bụ onyeisi otu Ọhanaeze Ndigbo kwuru na ihe na-eme ụfọdụ ndị nọbụ n'ọchịchị bụ na ha anaghi echeta na oge ọchịchị ha agaala nke mere ha ji aga n'ihu na-etinye aka nakwa ọnụ n'ihe gbasara oche ọchịchị ha nọbụ na ya nke ọ kpọrọ "Post Power Syndrome" na Bekee.
Ọ gara n'ihu dụọ ọdụ ka ndị chịbụrụ gbaa mbọ wepụ aka n'ọchịchị ka ndị nọ n'oche ọchịchị nwee ohere ma hụ ụzọ rụọ ọrụ ha.
"Ọ bụrụ na ndị ahụ nwere ụmụnne ha ga-ejiwe ha ejiwe, ọ bụrụ na ha enweghi ụmụnne ha ga-adịzị ka ndị ara n'ihu ọha."
Igbo kwesịrị iji aka ha hazie ala anyị- Leo Stan Ekeh
LeoStan Ekeh bụ onye ojiegoachụ ego a ma ama na Naijiria bụrụkwa onyeisi ụlọọrụ Zinox na Konga rụtụrụ aka na mkpa teknụzụ na agụmakwụkwọ dị na nkwalite akụnaụba Imo na ndị Imo.
N'okwu ya, ọ sị: "Dịka nchekwa na-egbochi ụmụ anyị ịgụ akwụkwọ na ịga ụlọ akwụkwọ ha, ndị ogbo ha na steeti ndị ọzọ anaghi echere ha. O kwukwara: "Anyị agaghi echere ka onyeisiala bịa nyere anyị aka, anyị kwesiri I ji aka anyị hazịe ala anyị."
Ohere inye ọrụ dị na Nollywood ma ọ bụrụ na Gọọmenti tinye ya ego- Onyeka Onwenu
Onyeka Onwenu toro Gọvanọ Uzodinma maka ọrụ ndị ọ rụọla ma sị na ihe aka ga-arụ riri nne, ọ kachasị na ọrụ ime obi aṅụrị nke gụnyere ime ejije, iti egwu, nakwa ime ihe onyonyo.
O kwuru na ebe a bụ ebe ọtụtụ ego dị ugbua dịka ndị mba ofesi na e legara ala Naijịrịa anya site n'ụzọ Nollywood.
O rịọrọ Gọvanọ Uzodinma ka o hibe usoro ga-akwado ndị ntorobịa nwere atụmatụ ibanye na ọrụ ndị a.
Ndị nwere agba bịara n'ọgbakọ ahụ gụnyere Emmanuel Iwuanyanwụ,Osote Gọvanọ Imo bụ Placid Njoku na ndị eze ọdịnala.