Ọ bụ eziokwu na Umahi chụrụ ndị otu ya na-arụ ọrụ n'okpuruọchịchị Anyim Pius?

Gọvanọ David Umahi achụọla ọtụtụ ndị na-arụ ọrụ n'okpuruọchịchị Ivo dị na steeti ya, ma sị ha chịpụta akwụkwọ gọọmentị niile dị ha n'aka ozugbo.

Ọchụchụ a metụtara ndị na-arụ n'ebe gọọmentị mapụtara maka mmepe obodo nke a kpọrọ "development center" na Bekee, ndị enyemaka, ndị enyemaka pụrụ iche, nakwa ndị ọzọ.

Ozi gbasara ọchụchụ ha si n'aka Kenneth Ugbala bụ odeakwụkwọ gọọmentị steeti ahụ, onye dere sị "N'ịkwụnyere ọchịchị ga-anabata mmadụ niile nke Bekee kpọrọ "inclusive governance", Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Ichie David Umahi ebinyela aka n'akwụkwọ ka a chụọ ndị ọrụ ndị enyemaka, ndị enyemaka pụrụ iche, ndị ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta ụlọ ọrụ na ụlọ ọrụ nakwa ndị ọrụ ndị ọzọ si n'okpuruọchịchị Ivo."

Okpuruọchịchị Ivo bụ ebe Anyim Pius Anyim bụbu onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ onye ya na Gọvanọ Umahi nwere esemokwu, si.

Nke a ga-eme ya ugboro abụọ n'ime ihe na-erughi otu izu Gọvanọ Umahi na-achụ ndị ọrụ ya, dịka ọ chụrụ ndị nke na-arụ n'okpuruọchịchị Ohaukwu bụ ebe Sam Egwu si, n'izu gara aga.

'Mmekọrịta Gọvanọ Umahi, Anyim Pius na Sam Egwu dịbu ka nnu na mmanụ tupu ha esewe okwu a'

Ụfọdụ ndị Ebonyi steeti na-atụ ụjọ ka esemokwu dị n'etiti Gọvanọ Dave Umahi, Anyim Pius Anyim bụ Onye bụbu Odeakwụkwọ Ukwu Naịjirịa na Sam Egwu, aka chịbụru Ebonyi, ghara ikpalite tigbuo-zọgbuo na steeti ahụ.

Nke a na-abịa dịka Anyim na Egwu bụ ndị isi a hụrụ kwaba okpu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị n'Ebonyi steeti sara Gọvanọ Umahi okwu n'ebubo o boro ha na ha chọrọ ikposa udo steeti ahụ.

Kingsley Amaechi bụ onye ọrụ na-eru n'okwu n'Ebonyi steeti kwuru na esemokwu mmadụ atọ a tụrụ ha n'anya n'ihi na "mmekọrịta ha dị ka nnu na mmanụ".

"Ọ dị ole na ole bụ ọgbakọ a ga-enwe ị na-agaghị ahụ ndị a ọ kachasị Sinetọ Sam Egwu. Tupu ugbua (esemokwu ha), gọvanọ na-akpọta ha abụọ dịka ndị bụ nna na a na-akwanyere ugwu na steeti a."

O kwuru na mmadụ abụọ a kwadokwara ọchịchị Umahi nke ọma, tupu esemokwu ha adapụta.

O kwuru na ọ bụ "ọchịchọ nke onwe" bụ ihe butere esemokwu n'etiti ndị a nwere agba n'ọchịchị Ebonyi steeti.

Amaechi na-atụ uche na ọ bụrụ na-ekwọghị mmiri oge ọ ka nọ n'obi ọkpa, nsogbu ịkpalite mụọ ndị omekome ịmalite mebiewa ihe ma gbuwe ndị mmadụ mmadụ n'ihi ndị kwe na ndị ekweghị.

Amaechi kwuru na ha ndị steeti Ebonyi nwere olileanya ma na-arịọ ka udo chịa na steeti ahụ, ka ọgbaghara ghara ịdapụta n'ihi okwu si mmadụ atọ a n'ọnụ.

N'otu aka ahụ, otu jịkọrọ ndị ụka Kraisti bụ CAN ngalaba nke Ebonyi steeti na-arịọkwa ka ek[pee udo iji gbalaụ tigbuo-zọgbuo na mmebi akụnaụba nwere ike ịdapụta ma ọ bụrụ na edozighị okwu ahụ.

Ebe Anyim kwụ

N'ọsịsa ya, Anyim bụbu odeakwụkwọ gọomentị Naịjiria degaara onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị isi ụlọọrụ nchekwa akwụkwọ ozi, ebe o kwuru na Umahi bụ onye anyaukwu nakwa onye oke ọchịchọ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na mmehie kacha njọ Umahi mere bụ ịkpọ ya na ụmụ Ebonyi ndị ọzọ garala obodo ha ozi, aha ọjọọ iji kparịa ha.

O kwuru na Umahi dị ka onye mmiri na-eri na-achọ onye ga-eso ya daa mmiri.

N'ime akwụkwọ ozi ahụ, o kwuputekwara etu Umahi si gbata n'ụlọ ya ịbịa rịọ ya ka o soro ya gafee pati All Progressives Congress (APC) dịka o si na People's Democratic Party (PDP) pụọ, mana ọ jụrụ ajụ; o kwuru na ọ bụ ya mere o ji akpọ ya bụ Anyim aha ọjọọ.

Ebe Egwu kwụ

N'aka nke ya, Egwu bụbu gọvanọ Ebonyi steeti nakwa minista agụmakwụkwọ na Naịjiria, sara ebubo Umahi sị na ya bụ ebubo anaghị echekasị ya.

O kwuru sị ka ndị nchekwa nwụchie ya bụ Egwu ma ọ bụrụ na o nwetula mgbe o kwutere okwu maọbụ nọrọ n'ọgbakọ ebe a nọ kpaa nkata maka iweta ọgbaghara na steeti ahụ.

O kwuru sị na ọ ghọtaghị etu ọ ga-esi kpaa nkata iweta ọgbaghara na steeti ọ chịburu.

O kwuru na onye ọbụla nwere ikike ịgafe pati ọbụla sọrọ ya, ma kwuo na ọ bụghị ihe ọjọọ na ha abụọ anọkọghị n'otu pati.