You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Independence Day Nigeria: Orji Uzor Kalu sị na ọ dịzị ka ndị Naịjirịa ahụzịghị onwe ha n'anya
Senetọ na-anọchite Abịa-North n'ụlọomeiwu ukwu bụ Orji Uzor Kalu kwuru na ọ bụ onye ọ masịrị ka Chineke ka ọ na-enye ọkwa.
Ọ sị na ọ bụghị ọkwa Onyeisiala kachasị mkpa ugbua na ọ bụ ndị mmadụ ka na-ekwu na ọ chọrọ ịzọ ọkwa a.
Mana ọ gara n'ihu kwuo na ya tozuru ịrụ ọrụ onyeisiala ma e nye ya ọkwa ahụ.