You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
South East Railway: 'Etu anyị ga-esi rụọ okporo ụgbọoloko ga-esi Port Harcourt gaa Owere na Aba na 2021' - Amaechi
Mịnịsta na-ahụ maka njem na Naịjirịa bụ Chibuike Amaechi ekwuola na ha nwere olileanya na okporo ụgbọoloko ga esi Port Harcourt gaa Aba na Owere ga-akwụrụ chịm n'afọ 2021.
O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC nwere n'ọdị nso a.
Amaechi kwuru na gọọmentị echefughị mpaghara ọwụwa anyanwụ dịka ha na-arụ okporo ụgbọoloko na mpaghara dị icheiche.
Ọ kọwakara ihe gbasara okporo ụgbọoloko gọọmentị Naịjirịa nke ga-eru mba Niger Repọlik.
Amaechi kwukwara uche ya gbasara ịzọ ọkwa onyeisiala na ntuliaka 2023.
O tinyekwara ọnụ n'okwu dị n'etiti ya na gọvanọ Rivers State bụ Nyesom Wike.
Gere ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu.
Ndị mere akụkọ a bụ Chiagozie Nwonwu na Vining Ogu.