Kayanmata: Jaruma asaala okwu Ned Nwoko

Ebe foto si, Jaruma,Ned Nwoko-Instagram
Onye na-ere ọla aka na ngwa ụmụnwaanyị bụ Hauwa Saidu a ma dịka Jaruma akatọọla Ned Nwoko maka ịkatọ nwunye ya na soshal midia maka okwu metụtara azụọ Kayanmata na azụghị.
Ned Nwoko wepụtara ozi ebe ọ kọwara ihe mere ya na nwaanyị ya bụ Laila jiri gbasaa ma kwuo na ọ bụrụ na Kayanmata nke a sị nwunye ọdụdụ ya bụ Regina Daniels ji jide ya na-arụ ọrụ, na Jaruma na-ere ya gaara e ji ya jide di ya na ya gbasara kemgbe afọ abụọ.
Mana Jaruma kwuru n'ihe onyonyo o wepụtara na soshal midia, na mkparị Nwoko nyere nwaanyị ya nke Moroko bụ Laila gosiri n'ezie na Kayanmata ya bụ Jaruma nyere Regina Daniel na-arụ ọrụ n'isi ya.
O kwuru na nkatọ Ned Nwoko nyere Laila bụ onye ya na ya birila afọ 10 dịka di na nwunye, mụkwaara ya ụmụ anọ adịghị mma.
"Ọ bụrụ na Kayanmata anaghị arụ ọrụ n'isi gị, kedụ ka nwa dị afọ 21 ga-esi mee gị ide ihe ị dere maka nwunye gị tinye na soshal midia n'aha gị."
"Ọ bụ ihe mwute na dịka onye ị hụrụla ọtọ ya, ya ahụ nke gị. Gị na ya lụrụ afọ 10. Ọ mụtara gị ụmụ anọ, ị na-akọtọ ya, onye i kwesịrị"
N'ọsịsa ihe Nwoko kwuru na ọ na-ejide nwoke, ọ sị:
"Haba nna anyị, kedụ ka gị dị afọ 74 ga-esi asị na mụnwa bụ nwa gị na-ere ọgwụ e ji ejide nwoke mana m ejidenwughị di m gbahapụrụ afọ abụọ gara aga?"
"M saa gị okwu ugbua, a sị na m na-akparị gị."
Jaruma kwuru na n'agbanyeghị na ya na di ya anọghịkwa, di ya anaghị ede akụkọ ọjọọ banyere ya n'ọha nke ya na-ede maka di ya dịka Nwoko siri dee maka nwunye ya bụ Laila.
Kayanmata: Ihe mere mụ na Laila nwunye m nke Morocco ji gbasaa - Ned Nwoko

Ebe foto si, Ned Nwoko/Instagram
Onye bụbu onyeomeiwu na ọgaranya a ma ama bụ Ned Nwoko ekwuola ihe mere ya na nwaanyị onye Moroko ọ lụrụ bụ Laila ji gbasaa bụ ndụ alabankọ ọ na-ebi nakwa ihe ndị ọzọ.
Nwoko kwuru nke n'ozi o wepụtara n'Instagram ụbọchị Wenezde nke ọ kpọrọ isiokwu ya, "Nke bụ Eziokwu maka mgbasa Ned Nwoko na nwunye ya nke onye Moroko".
Nwoko boro ebubo na Laila gara zute nwoke ọ hụrụ n'ịntanet n'ụlọ nkwari na Lọndọn oge ya na ụmụ ha gara ezumike ofesi.
Ọ sịrị, "Ya na otu nwoke amaghị onye ọ bụ na-akpa n'ekwentị."

Ebe foto si, Ned Nwoko
"Nchọpụta gosiri na ya na nwoke ahụ matara n'ọnwa Jenụwarị afọ 2021."
"Mana ihe niile gbara n'anwụ n'Ọgọstụ oge ya na ụmụaka gara ezumike na Lọndọn."
Nwoko bokwara ebubo na Laila gara waa ahụ iji dozi onwe ya na agwaghị ya agwa dịka di ya.
O kwukwara na hapụrụ ilekọta ụmụ ya anya oge ọ kpọrọ gaa ezumike Alabekee anya ọfụma nke mere ka ha mebie ihe pụrụ ya nnukwu ego idozi ihe ha mebiri.
Ozi a na-abịa dịka akụkọ na-efegharị na ọ bụ Regina Daniels ji arịa Kayamata were kụsaa alụmdinanwunye dị n'etiti Ned na Laila.
Kayamata: Regina Daniels ejịghị ọgwụ Jaruma jide m - Ned Nwoko

Ebe foto si, NedNwoko/Instagram
Ide ego a ma ama bụ Ned Nwoko akọwaala na ọ bụghị ọgwụ ka nwunye ya bụ Regina Daniels ji jide ya ya jiri lụọ ya.
Ned Nwoko nyere nkọwa a n'ụtụtụ Wenezde site n'akara Ịnstagram ya.
O kwuru nke a iji saa nwaada Hauwa Saidu a na-akpọ Jaruma bụ onye na-ekwu na ọ bụ ya nyere Regina Daniels ọgwụ o ji jide di ya.

Ebe foto si, Ned Nwoko
Ned Nwoko kwuru na onweghị ihe ọbụla gbasara ya na ọgwụ ọbụla Jaruma na-ere nke a na-akpọ 'kayanmata'.
Ọ gara n'ihu kwuo na "ọ bụrụ na 'kayanmata' na-arụ ọrụ, gịnị mere di Jaruma jiri gbaa ya alụkwaghịm?"
Ihe mere Ned Nwoko ji kọwaa nke a bụ maka okwu nwunye ya nke onye Morocco aha ya bụ Laila, bụ onye ha abụọ kewara n'ọdị nso a.
Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ọgwụ Jaruma kpatara Ned Nwoko na Laila jiri gbasaa.

Ebe foto si, Screengrab
N'akwụkwọ ozi ahụ o wepụtara n'akara Instagram ya, Ned Nwoko kwuru sị: "Anyị gaara agbachi nkịtị dịka asịrị a na-efesa, mana ọ bụrụ na a gbachi nkịtị, ọ ga-adịzị ka ọ bụ eziokwu."
"Ned Nwoko bụ onye a ma ama n'ụwa niile maka ime ọgọ, ọ gaghị agbachi nkịtị ka ndị asịrị tetọọ aha ya."
Ọ kọwara na ọ bụ ụdị ndụ Laila na-ebi kpatara esemokwu nke mere alụmdinanwunya ha jiri tisaa.
Gịnị na-esere Regina Daniels na Jaruma na-ere 'Kayanmata'?

Ebe foto si, Regina Daniels,Jaruma/Instagram
Onye ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Regina Daniels na Hauwa Saidu a ma dịka Jaruma na-achịpụ ya na na-achịpụ ya na soshal midia.
Nke a bụ dịka Regina gwara ndị na-eso ya na ya azụtụbeghị ngwa Jaruma na-ere na-agbanyeghị na ya na-ezipụta ozi banyere ngwahịa ya bụ nwaanyị na-ere na soshal midia.
Jaruma na-ere arịa ụmụnwaanyị a kpọrọ 'Kayanmata' n'asụsụ Awụsa.
Kayanmata pụtara 'ngwongwo ụmụnwaanyị n'asụsụ Awụsa mana ọ bụkwa aha a na-akpọ mkpọrọọgwụ maọbụ atịkpa a ma ama n' Ugwu Awụsa maka inyere n'aramara aka maọbụ ime ka mmadụ hụ mmadụ ibe ya n'anya nke ukwu.
N'agbara ọhụrụ a, e nwere ndị na-ere mgbanaka na mgbanụkwụ ha kpọrọ "kayamata" bụ nke ha na-ekwu na-arụ ọrụ ime ka onye onye chọrọ hụ ya n'anya nke ukwu.
N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya ụbọchụ Wenezde, Regina bụ nwunye Ned Nwoko,onye bụbụ onye omeiwu n'ụlọomeiwu Nta kwuru sị, "Ka m kwuo ya ka o do anya, azụnụbeghị nke m na-akwa ịzụ ahịa kayamata ọbụla."
Nke a na-abịa dịka ndị mmadụ na-ekpesara ya okwu na soshal midia na ọ bụ Kayanmata bụ ihe o jiri jide di ya.

Ebe foto si, Regina Daniels/Instagram
O kwuru na ya na Jaruma nwere nkwekọrịta ka ya gbasa ozi banyere ngwahịa ya n'akara ya nke ya bụ Jaruma kwụụ ya ụgwọ mana oge ya na ya kpebiri maka ịgbasa ozi ahụ agaala.
O kwuru na ya na Jarama siri na ikute ụtaba banye ọgbọahịa dịka ha sitere na nkwekọrịta azụmahịa bụrụ enyi na-agbayeghị na ndị mmadụ dọọrọ ya aka na ntị ya zeere nwaanyị ahụ.

Ebe foto si, Regina Daniels/Instagram
Ọ gara n'ihubo ebubo na Jaruma jizi enyi ha abụọ bụ were ya na-ewepụta ozi iji weere aha ya bụ Regina akpara ego.

Ebe foto si, Regina Daniel/Instagram
N'ọsịsa ya, Jaruma kwuru na ya kwụrụ Regina Daniel akatamkpo ego dị nde Naira iri (N10m) maka ịgbasara ya ozi ngwaahịa ya mana ọ bụ naanị ugboro atọ ka Regina tinyere ozi ahụ n'akara ya.

Ebe foto si, Jaruma/Instagram
O kwụkwara na ya emefuela puku kwuru puku n'isi Regina Daniels, nne ya na dị ezianụlọ ya nke na Regina agaghị asị na o mezuolarala ya ihe ya kwụrụ ya ụgwọ ka o meere ya.

Ebe foto si, Jarumaempire/Instagram

Ebe foto si, Jarumaempire/Instagram

Ebe foto si, Jarumaempire/Instagram
O gara n'ihu kwuo na ya nwere ihe aka ebe ga-agba ama ihe nile nke ya ga-ewepụta ma chi na-efo.









