Ned Nwoko: Ụlọikpe mkpegharị awụọla Nwoko ụkwụ n'ala

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa taa

Ụlọikpe anarala Ned Nwoko ụra rahụ

Ned Nwoko

Ebe foto si, Ned Nwoko/Facebook

Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja akagbuola mmeri Ned Nwoko dịka Senetọ na-anọchịte anya Delta-North n'ụlọomeiwu ukwu.

Ụlọikpe nọrọ n'ụbọchị Tọzde kwụọ na mkpebi ụlọikpe ukwu nke chụdarar Peter Nwaobosi ma nyere Nwoko mmeri adabaghị.

Ụlọikpe mkpeharị nke ọkaikpe atọ nọ n'isi ya kwuru na ụlọikpe ahụ kpere ike enweghị ikike ịnụ akwụkwọ ahụ nke Nwoko gbara.

Ha kwukwara na Nwoko onye gbara akwụkwọ ahụ kwesịrị ịgba ya abalị iri na anọ ihe o jiri maka ya gbaaa akwụkwọ mechara.

Cheta na Inec napụrụ Peter Nwaoboshị asambodo mmeri ha nyeburu ya dịka ụlọikpekswwu ebe Nwoko gbara akwụkwọ nyere mkpebi na ọ bụ Nwoko meriri.

Ncheta Biafra di ire n'Anambara mana ọdịchaghị ire n'alaigbo ndị ọzọ

Oku nọrọ n'ụlọ nke otu na-agba mbo maka nnwereonwe Biafra bụ Ipob kpọrọ taa bụ abali iri atọ nke ọnwa Mee mabụrụkwa Ụbọchi Ncheta Agha Biafra gara ka ụka akpara nke e ji isi ekwe n'ụfọdụ ebe ụfọdụ na Anambrara na Abia dịka Nnewi, Onitsha, Ogbunike, Aba na Afaukwu.

Umudike Junction, Umuahia
Nkọwa foto, Lee ndị mmadụ na ụgbọala n'Umudike Junction, Umuahia

Mana ndị mmadụ na-agara mkpa ha n'Enugwu, Imo State, Ebonyi .

Ihedioaha agọla na ọ́ka ya adịghị na nkutu Akachi

Akpụrụakpụ Akachi
Nkọwa foto, Akpụrụakpụ Akachi ka ọ dị taa bụ Wenezde

Ọnụ na-ekwuru Gọvanọ Emeka Ihedịọha nke Imo steeti bụ Steve Osuji ekwuola na gọọmenti steeti ahụ amaghị maka nkutu a gbalịrị ikutu akpụrụakpụ Akachi nke Rochas Okorocha kpụrụ ụbọchị Wenezde.

Onyeisiụlọomeiwu Imo steeti ọhụrụ agbaala arụkwaghịm

Lawman Duruji

Ebe foto si, Lawman Duruji/Facebook

Onyeisi ụlọomeiwu Imo steeti ọhụrụ bụ Lawman Duruji etinyela akwụkwọ arụkwaghịm naanị abalị abụọ ọ nọọrọ n'oche.

Duruji onye na-anọchite anya okpuru ọchịchị Ehime Mbanọ ekweghị hooha ihe mere o jiri tinye akwụkwọ arụkwaghịm.

Chinedu Offor

Ebe foto si, Chinedu Offor/Facebook

Ka ọ dị ugbua, Chinedu Offor werela oche dịka onyeisi ọhụrụ Ụlọomeiwu Imo steeti.

Gee akụkọ ndị ebe n'otu nkeji:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Fake certificate: Adeleke emeriela n'ụlọikpe mkpegharị

Ademola Adeleke

Ebe foto si, PDP

Ụlọikpe mkpegharị nọ n'Abuja akagbuola mkpebi ụlọikpe ukwu nke kwuburu na Ademola Adeleke etozughi izo ntuliaka gọvanọ Osun Steeti e mere n'afọ 2018.

Jọstis Othman Musaon nke ụlọikpe ukwu kpebiburu na Adeleke etozughị n'ihi na asambodo sekondrị ya bụ nke adigboroja.

Buhari ga-efepụ taa

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O mebeghi otu izuụka Buhari si Amerịka ebe ya na Donald Trump nwere ọgbakọ lọta.

Onyeisiala Naịjirịa ga efepụ ọzọ

Ọ bu ụnyaahụ ka Muhammadu Buhari ṅụrụ iyi ọrụ oji banye n'isioche Naịjirịa ọzọ

N'ụtụtụ a, ọ na-akwado ị ga mba Saụdị Arabịa. Buhari na-ga nzụkọ mba ndị so n'otu ụka alakụba bụ Ọrganisation of Islamic Countries.

Lee etu o ịṅụ iyi siri gaa ụnyaahụ abe a:

Ndị Chelsea

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Nke a mere ya ugboro abụọ Chelsea na-amabute iko Europa League a

Chelsea sụrụ Arsenal akwụ

Ụnyaahụ Chelsea sụrụ Arsenal akwụ n'asọmpị ha ji mechie Iko Europa.

Goolu Olivier Giroud , Pedro na abụọ Eden Hazard tiwara Arsenal obi, agbanyeghị na nwaafọ Naịjirịa Alex Iwobi dọkatara otu okpu.

Ndị uweoji Naịjiria

Ebe foto si, Getty/AFP

N'Anambra,

ndị uweojii ekwuola na ha etipiala otu aka ha dị n'izu ụmụaka.

Haruna Mohammed kwuru na ha ji umụnwaanyị abụọ na-akpa ike a ma zọpụtakwa otu onye nọ ha n'aka. Ọ gakwara n'ihu kwuo na ha ji mmadụ iri isii na itoolu maka echiche na ha so n'otu nzuzo.

Gee nkeji a ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri anyi nke taa:

Aha onyonyo, Ihe ngwa egwu Igbo jiri masị anyị - Chikaima na Chinonoru