Ihe ise mere Ndigbo ji alaghachi n'ịlụ ụbara Nwaanyị

Ndí na-ekpe ekpere

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị ụka na-ajụ ase n'aka ụkọchukwu ugbua
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ịlụ ụbara nwaanyị bụ ọdịwara gboo n'ala Igbo, ọ bụghị ihe ọhụrụ.

Mana ugbua, ọ na-adọ ụfọdụ ụmụnwoke na nwaanyị n'akpịrị dịka mmanụanwụ na-adọ ahụhụ n'akpịrị.

Na nsonso a, Ned Nwoko lụrụ onye ihe nkiri a ma ama bụ Regina Daniels ghọrọ okwu akụ n'ọnụ dịka akụkọ na ọ bụghị ya bụ nwaanyị nke mbụe na-ewu n'elu n'ala.

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Na nkọwa onye ọdịnala, Dkta Mcginger Ibeneme na onye ọkachamara n'ihe gbasara mmekọrịta mmadụ mabụụkwa onye ụkọchukwu bụ Pastọ Sebastine Nwaneri rụtụrụ aka n'ihe ndị a :

1. Ndagharị oge

Okpukperechi na-agbanwe. Ndigbo siri na ịgọ mụọ banye na otu Kraisti, si ebe ahụ na-agwa okpukpere abụọ ahụ ọnụ. Ugbua ụfọdụ na alaghachi na ịgọ mụọ na ihe ndị so ya.

N' okwu Dkta Ibeneme, ịgba ama, ịjụ asa nakwa ịga n'aka ụkọchukwu ịjụ he ga-eme na ihe mere buru emela ụfọdụ n'alaghachi ịgba afa na ndụ mgbe ochie.

Ọ sịrị, "O bidoro na ọtụtụ ndị ụkọchukwu ha na-emezi okpukpere ha,ha na-eweta ihe omenala na-etinye."

" Nwayọọ,nwayọọ, ndị be anyị na-alaghachi n'okpukperechi na omenala mgbe ochie."

Pastọ Nwaneri kpọọ ya, "ọgwụgwụ oge', mgbe ndị mmadụ na eso ndị amụma asị ndị na-ahụrụ ha ọhụ.

2. Ịchọọ ụbara mmadụ/ Amụtaghị nwa

Ndị egwu ụmụada
Nkọwa foto, Ụmụada Igbo

Site na mgbe ochie, mmadụ na-atọ Ndigbo ka nnu.

Ọtụtụ ndị gboo bụ ndị ọrụugbo ya mere ịmụta ụmụ ụbara na-adị ha mkpa.

Nke a mere ha ji alụ ọtụtụ nwaanyị.

Ugbua, amụtaghị nwa na-eme ka ụfọdụ Ndigbo lụọ karịa otu nwaanyị.

3. Ịchọ nwa nwoke

Nwa ọhụrụ na nne ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ịchọ nwa nwoke ebutela ọtụtụ ihe gụnyere ịlụ ụbara nwaanyị

Ọzọ yiri ya bụ amụtaghị nwa nwoke dịka Pastọ Sebastine Nwaneri siri kọwaa.

" Ndigbo na-achọ ịmụ nwa nwoke. Ọtụtụ ndị na-alụ ọtụtụ nwaanyị na-achọ ịmụ nwa nwoke."

"Ọtụtụ ndị ṅụrụ otu nwaanyị na-akwagharị iko ịchọ nwaanyị ga-amụtara ha nwa nwoke. "

Mana Nwaneri dụrụ ụmụnwoke ọdụ "Ihe m na-agwa ha bụ na ọbụ nwa nwoke ga-anọchite anya gị, ịzụ nwa nwaanyị ọfụma, o g-emere gị ihe nwanwoke agaghị emeliri gị."

Ọ dụkwara ha ka ha na-ekenye nwaanyị oke n'ihe ha nwere.

4. Akpịrị nwaanyị maọbụ akpịrị ego

Ụmụ ada

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ụmụasa juru eju n'elu ụwa ugbua

Ụmụnwaanyị Igbo mara mma dịka aja dị n'ala.

Nwoke ejighị onwe ya aka maọbụ nke nwere anyakwu ga-achọ ịlụ otu na ụmụ 'mmụọmiri' na-akpagharị n'ụwa ugbua.

Nwaneri onye bụ onyeisi Ụkọchukwu n'ụka Divine Impartation Assembly,Ikeja, Lagos kọwara,"Otu n'ime mkpụrụ onye chere echeghari na-amịta bụ mmadụ iji onwe ya aka.

"Ọ bụrụ n'ị lụọla nwaanyị, ịhụ ihe ụfọdụ iwepụ anya gị."

5. Ụdị ejiji ụmụnwaanyị na-eji ugbua

Nwa ada

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwaneri: Ejiji ụfọdụ ụmụnwaanyị na-etinye ụmụnwoke n'ọnwụnwa

Ụmụnwaanyị na-eyi uwe mbenukwu ugbua ma ghewe akụkụ ahụ ha oghe aghara aghara.

Pastọ Nwaneri kwuru na, "Ekwensu emela ka ọtụtụ ụmụnwaanyị na-eghbe akụkụ ahụ kwesiri ka egbuchie."

Akụkọ ga-amasị gị: