Haiti President killed: Ihe niile i kwesiri ịmata maka ogbugbu Onyeisiala Jovenel Moïse nke mba Haiti

Ebe foto si, AFP/EPA
Ndị uweojii mba Haiti sị na ọ bụ mmadụ 28 si mba ọzọ gụnyere ndị agha mba Colombia bụ ndị e gobiri ka ha gbagbuo Onyeisiala mba ha bụ Jovenel Moïse..
E gburu Moise n'ụlọ ya ụbọchị Wenezde, abalị asaa nke ọnwa Julai (7/7/2021).
Ndị uweojii kwuru na ha nwụchiri ndị omekome dị 17 ka ha kwachara mgbọ n'isiobodo mba ahụ bụ Port-au-Prince, ebe a nwuchiri ụfọdụ n'ụlọ ebe ha nọ were na-arụ ihe ha na-arụ, ebe a nwụchiri ndị ọzọ dịka ha wabara n'ụlọnnọchiteanya Taiwan na mba ahụ.
Ndi uweojii gbagburu atọ, ebe ha ka na-achọ mmadụ asatọ ndị ọzọ.

Ebe foto si, Reuters
Ndi uweojii gosiri ndị ntaakụkọ ndị a ana-enyo enyo dịka ọbara na apaọnya juchara ha ahụ Ụbọchị Tọzde ma gozikwa ngwaọgụ ha jiri kpaa ike.
Ka o di ugbua o dobeghị anya onye kpara nkata ahụ ghọrọ ngịga na ebunobi ya.
Cheta na ọ bụ n'ụzọ ụtụtụ Wenezde ka ndị bu egbe wakporo ụlọ onyeisiala dị na Port-au-Prince, gbagbuo ya, ma merụọ nwunye ya ahụ.
Ndị nọ n'ọchịchị kwuru na a hụrụ Moïse, gbara afọ 53, ka ọ tọgbọ n'ozu , apa mgbo dị 12 n'mkpụrụ anya gbapụtara ya.
E fegala Martine Moïse, dị 47, bụ onye meruru nnukwu ahụ Florida dị na mba Amerịka maka nleta.
Ngwaọgụ na akwụkwọ njem njirimara

Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii kwuru na ndị rụrụ Moise mgbuka bukartrị ndị Colombia, ebe ndị Haiti abụọ bụkwa ndị Amerika sokwa ha.
Ụọọụ ntakụkọ Le Nouvelliste kwuru na a hụrụ ngwaọgụ, dọla, akwụkwọ ego onyeisiala, ha igwe kọpụta e ji ahazi onyonyo nzuzo n'ụlọ onyeisiala.
Mba Taiwan kwetara n'ezie na mmadụ 11 n'ime ndị a na-enyo maka ịkpa mkpamkpa bụ ndị a nwuchiri dịka ha wabatara na ngwuru ha.
Ndị nkiti iwe ji soro na-achọị ndị ahụ bu egbe ma nyere ndị uweojii aka inweta ụfọdụ ebe ha zoro n'ọhịa.
Igwe mmadụ sunyere ụgbọla atọ nke ndị a na-achọ achọ site n'etu ahu bibie ihe akaebe.
Otu nwoke gwara ụlọakụkọ AFP sị, "Obi adịghị anyị bụ ndị Haiti mma maka ihe mere. Anyị anabataghị ya."
"Anyị dị njikere Inye aka n'ụzọ abụla ụzọ n'ihi na anyị chọọ ịmata onye kpara nkata ahụ, aha ha, ebe ha si, ka e were nwee ikpe nkwomoto."
Onye ji Ọchịchị Haiti Ugbua?

Ebe foto si, EPA
Ọnwụ Moise butere mgbakwojuanya onye kwesịrị iji ọchịchị ganye ma mba ahụ mee ntuliaka.
Iwu ala ahụ edochaghị anya n'ihi na enweghị ụlọomeiwu na mba ahụ ugbua. nsogbu bụ ihe mere na ntuliaka nke e kwesịburu ime n'ọnwa Oktoba afọ 2019 emeghị.
Mmegharị Iwu kweiburu inye ohere ka JClaude Joseph bụ Praim Minista weghara ọchịchị Mana a na-ekwu na iwu akwadoghị ọnụnọ Joseph n'Ọkwa ya.
A kpọpụtaburu Ariel Henry dịka onye prime minista ọhụru mana e dubeghị ya n'iyiọrụ tupu ọdachi ahụ adaa.
Otu United Nation na-atụ alo Ka Joseph jide ọchịchị rue oge a ga-eme ntuliaka na ngwụcha afọ a.
E gbuola mmadụ anọ n'ime ndị gburu Onyeisiala Jovenel Moïse nke mba Haiti

Ebe foto si, Reuters
Ndị uweojii na mba Haiti ekwuola na ha egbuola mmadụ anọ ha na-eche na-aka ha dị n'ogbugbu onyeisiala mba ahụ bụ Jovenel Moïse ma merụọ nwunye ya ahụ n'ụlọ ya dị n'isiobodo mba ahụ bụ Port-au-Prince.
Ndị uweojii sịkwa na ha nwuchiri mmadụ abụọ aka ha dị n'ihe a.
Cheta na Praim Minista mba ahụ bụ Claude Joseph kwuru na ndị bu egbe amaghị ndị ha bụ wakporo be onyeisiala n'Elekere Mbụ.
Joseph kporo oku ka onye ọbụla dere jụụ dịka"a na-agba mbọ ịhụ na ọchịchị a na-aga n'ihu."
Moïse gbara afọ 53 banyere ọchịchị kemgbe afọ 2017 mana ngagharịiwe ebe a na-akpọ oku ka ọ rituo n'ọkwa karịrị dịka ụfọdụ na-ebo ọchịchị ya ebubo nrụrụaka.
Joseph kpọrọ mgbagbu Onyeisiala "arụ ka arụ ekweghịghị ekwesị" dịka o kwukwara na ndị mere ya bụ ihe na-asụ asụsụ "Bekee" na "Spanish".
O kwughị ihe ọzọ karịa ihe ndị a.
O kwuru na a na-elebara ọnọdu ụkọ mba ahụ nọ na ya, gaa n'ihu sị, "ọchịchị onyekwuoucheya na obodo a ga-enwe mmeri".
Praim Mịnịsta mba Briten bụ Boris Johnson kwuru n'akara Twitter " ọnwụ Moise "juru" ya anya anya ma "wute" ya.
Ụlọọrụ Onyeisiala Mba Amerịka kwụrtụ na ya bụ mpụ bụ 'arụ kwọ nwa".
Mba Dominican Republic bụ agbataobi Haiti enyela iwu ka e mechie agbata ha abụọ ozigbo ozigbo
Ka ọ dị ugbua, nwunye Moise na-anara ọgwụ n'ụlọọgwụ mana ọnọdụ ọ nọ edobeghị anya.
Ndị anọghị na gọọmentị na mba ahụ na-ekwu na ọchịchị Moise kwesiburu ịbịa na njedebe n'abalị asaa nke ọnwa Febrụwarị afọ 2021, nke bụ afọ ise onye nọbu n'ọkwa onyeisiala mba ahụ tupu ọ banye bụ Michel Martelly,rịturu n'ọchịchị.
Etu e si gbuo ndị a
Onyeisi ndị uweojii na Haiti bụ Leon Charles kwuru na ha chebiri ndi a n'ụzọ.
Ọ sị: "Mmadụ anọ n'ime ndị a nwụrụ oge anyị zutere ha. Anyị zọpụtakwara ndị uweojii atọ ha nwuchiri n'oge ha na gburu onyeisiala anyị."
"Anyị gbochiri ụzọ ha si ala dịka ha kpachara arụ a. Anyị na-ebuso ha agha kemgbe ahụ."
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- Sefer Torah a e kwuru na Nnamdi Kanu kwuru maka ya ọ pụtara gịnị?
- Akụkọ ụgha ise na-efeghari maka nnwụchi Nnamdi Kanu
- Ebe na etu anyị si nwụchịe Nnamdi Kanu - Gọọmenti etiti
- Ebe ndị Ugwu na-akwado Pantami, Gumi na Miyetti Allah, ana m akwado Nnamdi Kanu - Bishop Onuagha, Methodist Church, Onitsha Diocese
Akụkọ ka na-abịa











