Samia Suluhu Hassan: Ihe ndị i kwesịrị ịma maka onyeisiala nwaanyị mbu na Tanzania

Ebe foto si, Twitter/@SuluhuSamia
Na mgbede Wenezde, ka ọ gwara ndị Tanzania na Onyeisiala ha anwụọla, na ụbọchị Tọzde ka e duru ya iyi ọrụ dịka Samia Suluhu Hasssan dịka Onyeisiala mba ahụ.
Hassan sobu Magufuli zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2015 dịka osote ya, ha merịkwara ọzọ n'afọ 2020, ebe ọ ga-achịtọpụ afọ ole fọ®ọ n'afọ ise nke ọchịchị ha.
Ọ ga-abụ naanị nwaanyị bụ onyeisiala ugbua,(nwaanyị bụ isi nke mba Ethiopia bụ naanị n'aha), ma soro n'otu n'ime ụmụnwaanyị ole na ole n'Afrịka rutere na nnukwu ọkwa a.
Nwaanyị ahụ dị afọ 61 bụ onye ndị hụrụ ya na-nya na-akpọ ya, "MamaSamia".
Ọ tụrụ ndị mmadụ n'anya oge a họrọ ya dịka onye ga-eso Magufuli zọọ ọkwa n'afọ 2015, gbahapụcha ndị ka ya nwee agba na pati ha bụ Chama Cha Mapinduzi (CCM), patị ahụ anọọrọla n'ụdị di iche iche kemgbe ha nwere onwe ha n'afọ 1961.
Hassan banyere ọkwa ọchịchị mbụ ya n'afọ 2000, mana ọ maliere wube ewu n'afọ 2014 dịka osote onyeisi ọgbakọ wepụtara Iwu ọhụrụ ala ahụ.
Ebe ahụ o jiri obi dara jụụ na-eso ọgbaghara dapụtachara marakwa ụzọ o si adatu obi ndị n'ekwupụtaka uche ha dị.
Ndu Hassan dịka onye nkịtị
A mụrụ ya n'ọnwa Jenụwarị afọ 1960 na Zanziba, dị na Tanzania. Ọ gụrụ "Public administration', na Tanzania ma gaa n'iru gụkwa ya na Manchester University dị na mba Briten.
N'afọ 1978, ọ lụrụ Hafidh Ameir, bụ onye a ma dịka onye nkuzi mahadum na-akụzi gbasara ọrụụgbo mana ọ naghị achọ ka a nụ ụda aha ya.
Kemgbe Samia bụrụ Osote Onyeisiala, a hụbeghị ebe ya na nwunye ya sere foto.
Ha mụrụ anọ nke otu n'ime ha bụ Mwanu Hafidh Ameir, bụ onye ụlọnnochite anya Zanzibar ugbua.
Ụmụnwaanyị bụrụla Onyeisiala n'Afrịka
- 1993 - Slyvie Kiningi - Ọ nọrọ ka Onyeisiala Burundi -Ka e gbuchara Melchior Ndadaye
- 2006-2018 - Ellen Johnson Sirleaf - E ji ntuliaka họpụta ya dịka Onyeisiala Liberia
- 2009 - Rose Francine Rogombé - Ọ nọrọ ka Onyeisiala Gabon ka Omar Bongo
- 2012 - Monique Ohsan Bellepeau - Ọ nọrọ ka Onyeisiala Mauritius ka Sir Anerood Jugnauth tinyechara akwụkwọ arụkwaghịm
- 2012-2014 - Joyce Banda - Onyeisiala Malawi ka Bingu wa Mutharika nwụchara
- 2014-2016 - Catherine Samba-Panza - Onyeisiala haziri nnyefe ọchịchị aka nke mba Central Africa Republic
- 2015-2018 - Ameenah Gurib-Fakim - Onyeisiala Mauritius, nke ụlọomeiwu ha họpụtara
- 2018-rue ugbua Sahle-Work Zewde - Onyeisiala Ethiopia, nke ụlọomeiwu ha họpụtara
Samia Suluhu Hassan bụ osote onyeisiala ga-aghọ Onyeisiala Tanzania

Ebe foto si, Twitter
Anya niile awụkwasala Osote Onyeisila mba Tanzania, bụ Samia Suluhu Hassan, dịka onyeisiala mba ahụ bụ John Magufuli nwụrụ n'ụbọchị Wenesde dịka o nwechara gbalụgbalụ ọria obi n'otu ụlọ ọgwụ dị na Dar es Salaam.
Nke a gbakwasara ụkwụ kpọkwem n'akwụkwọ iwu mba Tanzania, a ga-edu Odoziakụ Hassan n'iyi dịka onyeisiala ọhụrụ mba Tanzania ga-achapụcha oge ọkwa ọchichi fọrọ afọ nke Magufuli nwere afọ ise bidoro n'afọ gara aga.
"Ebe enwere oghere n'ọkwa ọchichi onyeisila nihi ọnwụ, aga edu n'iyi ọrọ osote Onyeisla dika ọga abụ onyeisiala ruo mgbe oge ọchịchị afọ ise nke oche ọchịchị a fọrọ afọ" bụ ihe akwụkwọ iwu mba Tanzania kpuhere.
E duo nwaanyị a n'iyi ọrụ, ọ g- abụ nwaanyị mbụ bụrụ onyeisiala mba ahụ ma bụrụkwa nwaanyị nọọrọ n'oche ọchichi onyeisiala na mpagara Ọwụwa Anyanwụ Afrịka.









