You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ada Jesus burial : Lee ka o si aga n'akwamozu ọkpaọchi a
Akwa na Anyammiri bụ ihe na-eru ka mmiri n'akwamozu Mmesoma Nnadi , onye ọkpachị a ma ama dịka Ada Jesus nke mere n'obodo dị ya bụ di ya n'ụbọchị Ejemewuru Oguta, Imo Steetị na Fraide(28/5/2021).
Ada Jesus nwụrụ n'abalị 21 nke ọnwa Eprelu ka ọ rịachara ọrịa nwa oge site n'ọrịa akịrị.
Ọ dị afọ nnaanị afọ 24 ka ọ nwụrụ.
Igwe mmadụ gụnyere ezinaụlọ, ndị enyi, ndị ọgọ na ọtụtụ ndị ntorobia jupụtara dịka e buru ozu ya site n'ụlọozu Aladinma gawa obodo di ya dị n' Ejemekwuru n'Oguta 2, n'Okpuru Ọchịchị Ugwuta n'Imo steeti.
Ụzụ akwa tụrụ n'elu na ala, obere na nnukwu dịka ozu nwata nwaanyị ahụ wuru ewu karịa okenye na-alọta be ndị di ya.
Nne, nna, okoro na agbọghọ chị anyammiri n'aka.
E mechara bụga ya n'ama ụlọakwụkwọ ndị n'ogbe ahụ maka ịkwanyere ya ugwu ikpeazụ.
Control Jay bụ onye na-ahaziri ya ihe ejije kwuru na "ekwebeghị m na ọ nwụọla".
'Echeghị m na o nwere onye ga-echezọ Ada Jesus n'afọ 50 na-abịa."