Ada Jesus dead: Harrison Gwamnishu akọwaala etu Ada Jesus si nwụọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Harrison Gwamnishu bụ onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onwe ya agbaala ama na e burula ozu ọkpaochị Mmesoma Obi gawa Ala Igbo maka akwamozu na olili ya.

Ada Jesus nwụrụ n'ụzọ ụtụtụ ụbọchị Wenezde, n'ụlọọgwụ Zenith Medical Centre, dị n'Abuja .

Dịka Gwamnishu siri gwa BBC Igbo na mkparịtaụka anyị na ya nwere n'ụtụtụ Tọzde, ndị dokịta chọpụtara ọrịa gụnyere ọrịa akịrị, kansa nke ara nakwa mkpọnwụ ahụ n'ahụ ya ka ha nyochara ya.

O kwuru na ndị dọkịta nyere ya nleta mere ka ọnọdụ ya dịtụ mma tupu ọnọdụ ya akawanye njọ n'abali Tuzde mgbe a dụchara ntụtụ, "ọ kwụsịrị ikwu okwu tupu dọkịta agwa anyị na ọ nwụọla".

Gwamnishu sị, "ọ bụrụ na anyị matara n'oge maka ọnọdụ ahụike ya, ikekwe ọ gaghị anwụ."

"Mana otu ihe mere bụ na ndị mmadụ gosiri ya ịhụnanya n'oge ikpeazụ ya."

"O nwere ọgwụ a gbara ya, di ya kwuru na ọ bụ ka a gbachara ya otu ọgwụ ka ahụ bịara na-agbakasị ya, na-enye ya nsogbu."

O kwukwara sị na ọ bụghị 'ihe e zigara eziga' dịka ihe mmụọ tinyere Ada na nsogbu ahụ, na ọ bụ na ekwuputaghị maka ọrịa a n'oge.

O kwukwara na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na-akpọ ya na-ekwu na ha chọrọ iji obiọma ha nye Ada Jesus akịrị nke ha, iji hụ na ọ gbakere ma nwere onwe ya.

Gere mkparịtaụka ya na BBC Igbo n'uju ebe a:

Lee ihe Gwamnishu kwuru na Facebook ya:

Ada Jesus death: Abụ m mkpụrụ agaghị egbuli egbu - Rita Edochie

Omee ihe ejije a ma ama bụ Rita Edochie ekwuola na ya bụ "mkpụrụ agaghị egbuli egbu".

Nke a bụ nkwupụta mbụ ya ka ọ gachara otu abalị ọkpaọchi Mmesoma Mercy Obi bụ onye a ma dịka 'Ada Jesus' jiri nwụọ.

N'ozi o wepụtara n'akara Instagram ya, ọ sịrị na Chukwu mere ya nwaanyị siri ike nke ya ga-abụgide.

"Chukwu ji ike niile mere m nwaanyị siri ike, aga m adịrirị etu ahụ."

"Mkpụrụ a gaghị egbuli egbu."

Tupu Ada Jesus anwụọ, ya na Rita Edochie nwere nghọtahie nke mere ka Edochie kwuo na ọ gaghị agbaghara ya, mana n'izu ole na ole gara aga tupu Ada Jesus anwụọ, Edochie kwuru na ọ gbagharala ya.

Mana dịka Edochie mere nkwupụta ahụ taa bụ Tọzde, ọtụtụ na-eso ya na-akatọ ya maka enweghị obi mgbaghara, ebe ụfọdụ kpọrọ oku ka a kwụsị ikiri ihe ejije o so na ya.

Rita Edochie, Odumeje na ihe ndị ọzọ a kpụ n'ọnụ maka ọnwụ Ada Jesus

Naijiria dị ndị ezinaụlọ ya na ndị ihe ya amasi ka Ghana dịka akụkọ ọnwụ ya pụtara ihe taa bụ Wenezde.

Mercy Mmesoma Obi a ma dịka "Ada Jesus' nwụrụ n'ụlọọgwụ dị n'Abuja e bugara ya maka ịgwọ ya ọrịa metụtara akịrị.

Dịka akụkọ siri kwuo, ọnọdụ ya kawanyere njọ n'abali Tuzde foro Wenezde, ebe ọ nwụrụ n'ụtụtụ taa ka o mechara abalị ole na ole o jiri mechaa ncheta afọ 23 a mụrụ ya.

Ihe ndị ị kwesịrị ịma maka Ada Jesus

Ọtụtụ ndị mmadụ ma Ada Jesus dịka ọkpachị ma lee ihe ndị ụfọdụ ị maghị maka ya:

  • Ọ bụ onye Ọlụ n' Imo steeti
  • Ọ lụrụ di aha ya bụ Kingsley Chuks Nnadi, mụta otu nwa
  • Ya na di ya nweburu nghọtahie mana ha doziri oge ọrịa ya malitere
  • Ọrịa malitere ịrịa Ada Jesus n'afọ 2019 mana ọ bụ n'afọ 2020 ka ọnọdụ ahụike wuwere ewu.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ ya

Ọnwụ ya bụkwa ihe butere mwute nakwa arịrị n'uche ọtụtụ ndị mmadụ n'ihi na ọrịa ọ rịa ọtụtụ oge tupu ọ nwụọ.

Lee ihe ha na-ekwu na soshal midia maka ọnwụ ya:

Ọtụtụ ndị ihe Ada Jesus na-amasị na-akatọ onye na-eme ihe ejije a ma ama bụ Rita Edochie nakwa ụkọchukwu Chukwunaeme Ohanaeme a ma dịka 'Odumeje' maka okwu ha kwuru makaAda Jesus dịka ọ nọ n'akwa ọrịa.

Edochie na Odumeje kwuburu na ha agaghị agbaghara Ada Jesus maka okwu ndị o kwugide ha nke ha kwuru bụ okwu asị.

Adaeze siri na Edochie kwuru na isi Ada Jesus agaghị eji isi ya pụta n'ọrịa ya, na ugbua a na okwu ahụ emezuola.

Chumalo kwuru na ọ bụrụ ezie na Ada Jesus anwụọla, na Rita Edochie kwesịị ịza ajụjụ maka ya.

Bigjohn na-ekwu na Odumeje na Rita Edochie anaghị agbaghara mmadụ, kedụ ka ha sị arịọ chukwu mgbaghara.

Everest na-ekwu na ọ nwụghị maka na ọ kparịrị Odumeje na Rita Edochie, na ọ bụ ọnwụ buru ya.

Captain Aluko na-ekwu ka Chineke gbaghara ndị niile jụrụ ịgbaghara ya.

Oge BBC gbalịrị ịnụta olu Rita Edochie maka ihe na-akpọtụ, ọ zaara ekwentị ya ma gwa anyị na ya nọ na nzukọ na ya enweghị ike ikwu ihe ọbụla ugbua.

Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na ọbụghị ọgụ mmụọ gburu Ada Jesus, na ọbụ ọrịa akịrị nakwa enweghị ezi nleta n'oge.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị