Ada Jesus: Anyị agbagharala nwada a ma na-arịọ Chineke ka ọ gbakee n'ọrịa

Ọtụtụ ndị mmadụ apụtala ikwu gbasara ọkpa ọchị e ji Ada Jesus mara, n'ihi ahụ na-arịa ya ugbua.

Ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ọtụtụ ndị Ada Jesus kparịrị bụrụ ya ọnụ nke kpatara o jiri daa n'ọrịa.

Mana Ada Jesus arịọla ndị niile o mejọrọ mgbaghara, ma kwukwaa ka onye ọbụla chefuo ihe tara n'abalị ka ọ bụrụ anwụnta.

BBC kpọtụụrụ mmadụ atọ n'ime ndị sị na Ada Jesus kparịrị ha n'agbanyeghị na ha emeghị ya ihe ọbụla.

Lee ihe ha kwuru maka ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: