Joe Biden enwetela ikike n'aka ndi omeiwu ịbụ onyeisiala site 2021 ruo 2024

Ebe foto si, Reuters
Nke mere ugbua bụ na Osote Onyeisiala Amerịka bụ Mike Pence kpọpụtara mpụtara ntuliaka emere na mba ahu a 2020 ma kwuo na ndị Omeiwu ha anabatala mpụtara ha nke mere Joe Biden Onyeisiala ma mee Kamala Harris Osote ya.
Nke na-abịa dịka ndị Omeiwu si pati Repọblịkan gbara mbọ ịkagbu mmeri Biden na ụfọdụ steeti.
Ka nke a mere, Ọbi Onyeisiala Amerịka wepụtara ozi na Onyeisiala Amerịka bu Donald Trump ekwenyela "enyefe ọchịchị n'udo" n'oge Biden ga-aṅụ iyi ọrụ na Jenụwarị 20.
Mana, n'okwu a Trump gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ ya meriri ntuliaka e mere n'afọ 2020.
Na chi bọrọ ụbọchị 7 nke ọnwa Jenụwarị 2020, Trump zigara ndi na-akwado ya ka ha gaa wakpo ụlọ Omeiwu eji Capitol mara dịka ndị omeiwu na-arụrịtaụka banyere mpụtara ntuliaka 2020 ahụ.
Ndị Amerịka hụrụ ihe ha ahụbeghị mbụ dịka mwakpo ahu na-aga n'ihu.
Pence emeghị ihe Trump rịọrọ ya

Ebe foto si, Getty Images
Dịka Onyeisi Ụlọ Omeiwu Ukwu, ọ bụ Mike Pence gupụtara mkpebi ndị omeiwu wepụtara.
Ihe a o mere ka ọ bụrụ na ọ gbajọrọ arịrịọ Trump rịọrọ ya ka ọ kagbuo mmeri Biden.
Ndi ọzọ ekweghi ime ieh Trump chọrọ bụ Onyeisi Pati kachasị na Ụlọ Omeiwu Ukwu bụ Mitch McConnell.
Ndị na-arụ ọrụ na White House agbaala arụkwaghịm
Iwe ihe a mere na Capitol mere ka ụfọdụ ndị na arụ ọrụ na Whiet House rituo n'ọkwa ha.
E nwekere mkparịtaụka atumatụ iji iwu a kpọrọ "25th Amendment" chụọ Trump n'ọrụ. Iwu a bu maka usoro eji achụtu onyeisiala anaghi arụ ọrụ ọfụma n'ọrụ.
Ọ bụ Ilhan Omar na-ahazie atụmatụ ịchụ Trump n'ọrụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post









