Femi Otedola: Ugboro atọ ya, Tolani na ụmụ ya ndị ọzọ wuru na soshal midia

Femi Otedola

Ebe foto si, Femi Otedola/DjCuppy/Instagram

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ojiegoachụego a ma ama bụ Femi Otedola bụ onye akụkọ banyere ya na-adị ntị ụmụ Naijiria mma oge ọbụla nke mere ndị ntaakụkọ na-eji ya eme isiokwu.

Ụmụ ya atọ bụ Cuppy, Tolani nakwa JTO so ya ewu na soshal midia taa maka ihe o meere ha.

Ọgaranya bụ omume omume ma ọ bụrụ onye otiegwu, ọ na-eme ihe dịka ọ siri gụọ ya.

Lee ụfọdụ ugboro Otedola bụ nwa gọvanọ chịbụrụ Legọs bụ ‎Michael Otedola wuru ewu na soshal midia:

1. Ọ zụrụ ụmụ ya ụgbọala atọ dara N80,000,000 n'otu ụbọchị

Ụgbọala Ferrari Portifino

Ebe foto si, Cuppymusic

Taa bụ Wenezde, o bidoro iwu na soshal midia dịka ọ pụtara ihe na ọ zụrụ ụmụ ya atọ ụgbọala Ferrari atọ.

Ọ bụ nwa Otedola nke nwaanyị na-agwọkọ egwu bụ Florence Otedola a ma ama dịka 'DJ Cuppy' bụ onye gbara ama nke a na soshal midia.

Ụmụ ya nwaanyị atọ ritere erere ahụ bụ; Tolani Otedola( ọgụegwụ, Florence Ifeoluwa Otedola(DJ Cuppy- ọgwọkọ egwu) na Temi Otedola.

DJ Cuppy father Femi Otedola gift Ferrari Portofino to im daughters

Ebe foto si, DJ Cuppy

Ya bụ akụkọ chọrọ ịgbawa ịntanetị n'ihi na ụgbọala Ferrari Portifino ahụ Otedola zụrụ ụmụ ya atọ na-ada ihe karịrị ruru nde Naira iri asatọ(N80,000,000) maọbụ narị dọla abụọ na ụma iri na asatọ( $218,750).

2. Oge ọ bara 'Molue' na Legos

Femi Otedola n'ime Molue

Ebe foto si, Otedola

Nkọwa foto, Femi Otedola n'ime Molue

Aha Femi Otedola kpọtụrụ n'afọ 2018 oge ihe onyonyo gosiri ya ka ọ banyere ụgbọala 'Molue' na Legos fegharịrị na soshal midia.

Molue bụ ụgbọala e jiri mara ndị ụwa na-atụ n'ọnụ a Legọs nke mere ya bụ ihe jiri bụrụ nnukwu akụkọ dịka ndị mmadụ na-ajụ ihe mere n'ọgaranya iri ehi nwere ike ịbanye ụgbọala ahụ.

Ụfọdụ bidoro na-ekwu na ikekwe ọ chọrọ ịzọ ọkwa ọchịchị, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ chọọ ịma etu ụwa onye ogbenye na-adị.

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

3. Ya na ụmụ ya gara ịzụ 'Ice cream' n'ala Bekee

Femi Otedola na nwa ya nwaanyí

Ebe foto si, Cuppymusic/Instragram

Nkọwa foto, Femi Otedola na nwa ya nwaanyị gara Italy nọọ naanị otu awa iji zụrụ 'ice cream'

Ọgaranya bụ iri ihe gụrụ gị mgbe ọ gụrụ gị oge ọ gụrụ gị.

Femi Otedola na ụmụnwaayị agatụla Monaco dị na mba Italy nọọ naanị otu awa iji zụụ 'Ice Cream gụrụ ha a kpọrọ "Gelato".

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2