Leah Sharibu, Dadiyata... ndị na-efu efu na Naịjirịa karịrị akarị
Na Naịjirịa ka ọnụọgụgụ ndị a na-achọ achọ kachasị na mba ụwa niile, dịka ndị otu ‘Red Cross’ si kwuo.
Onweghi mpaghara Naijiria ọbụla ugbua ya bu ihe emetutaghị.
Abalị iri atọ nke ọnwa Ọgọst bụ ụbọchị otu ‘United Nations’ ji echeta ndi niile a na-achọ achọ n’ụwa, nke mere BBC Igbo ji leghachi anya azụ icheta ndị niile a na-achọ achọ na Naịjirịa.
Onweghi etu mmadụ ga-esi matachaa ndị niile a na-achọ achọ, mana anyị chetara ndị akụkọ ha wuru ewu.
Leah Sharibu

Ebe foto si, The Cable
Kedụ maka Leah Sharibu, nwata akwụkwụ ndi Boko Haram tọọrọ ya na ụmụakwụkwọ ibe ya na Dapchi dị na Borno steeti.
Ha mechara tọghapụ ụmụakwụkwọ ndị ọzọ, mana ha ahapụghị Leah Sharibu n’ihi na o kweghi ịhapụ okpukperechi nke Kraist banye na nke Alakuba.
Ruo taa, Leah ka na-efu efu.
Abubakar Idris (Dadiyata)

Ebe foto si, Dadiyata
N’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Ọgost afọ 2019 ka akụkọ pụtara na Abubakar Idris, onye e ji Dadiyata mara, na-efu efu.
Idris bu otu onye a ma ama na-akatọ onyeisiala Muhammadu Buhari nakwa ọtụtụ ndị ọchịchị ndị ọzọ na mpaghara ugwu Naijiria.
Ọ gafeela otu afọ e ji chọwa Dadiyata achọ, mana anya ahubeghi ya ọzọ ruo taa.
Ụmụaka Chibok

Ebe foto si, AFP
Chetakwa na ọtụtụ n’ime ụmụakwụkwọ ndi Boko Haram tọọrọ kamgbe afọ 2014 enwebeghi onye huru ha ruo taa.
Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ n'ime ha alọtala dịka gọọmentị etiti na ndị Boko Haram nwechara nkwekọrịta, mana ihe karịrị otu narị n'ime ha ka tọrọ n'aka ndị ekperima ahụ.
N'ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Eprel afọ 2020 ka Onyeisiala Muhammadu Buhari kwere nkwa na gọọmentị echefubeghi maka ụmụaka Chibok.

Ebe foto si, Nigerian Presidency
O kwuru sị: "Anyị agaghị ekwe ka ụra buru anyị gbasara okwu a."
"Anyị nwere olileanya na mbọ niile anyị na-agba ugbua iji kpọlata ha ga-amịta ezi mkpụrụ".
N'otu aka ahụ kwa, ndịọrụ nchekwa dị icheiche na-ekwu na ha na-agbalị ike ha ịhụ na ndi niile na-efu efu lọghachiri, mana ka ọ di ugbua, ihe na-ebe ka na-ebesi ike.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
- 'Ndụ anyị nọ n'ụjọ ugbua maka ogbunigwe ndị ka fọrọ n'Eziorsu'
- Ụzọ ise ndị Igbo si echekwa ogige ha mgbe gboo ndị ụgbụa kwesiri mụta
- Chadwick Boseman mere ejije Black Panther anwụọla n'ọrịa Cancer
- Etu mba ndị ọzọ si eziga 'drone' na-agbagbusi ndịagha na Libya
- Onye nke atọ merụrụ ahụ n'ihe mberede ụgbọelu mere na Legọs anwụọla

