Eziorsu:'Ndụ anyị nọ n'ụjọ ugbua maka ogbunigwe ndị ka fọrọ n'ala anyị'
Mgbe e biputara ya
Ndị Eziorsu dị n'Oguta Imo steeti akpọkuọla gọọmenti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka maka ogbunigwe ka fọrọ n'ala ha.
Ha kwuru na ogbunigwe na-agbawachaghị ọfụma n'oge alụrụ agha Biafra ka nọcha n'ime ala ha nke mere na ezigbo ụjọ ji ha ugbua.