Biafra: 'Ndị IPOB anyị jidere egbuola ụfọdụ ndị uweojii' - Delta Police

Ndí uweojii na ndí IPOB

Ebe foto si, Getty Images & NPF Facebook

Ndị uweojii nke Delta steeti akpụpụtala mmadụ iri ha boro ebubo ịbụ ndị otu amachiri amachi bụ IPOB nakwa ịnapụ ndị uweojii egbe ha .

Akụkọ na-akọwa na ndị a nwere ebe atọ ha na-ezo n'ime ọhịa nke dị n'Ibusa,Okpanam na Illah dị na Delta steeti.

Ndị uweojii kwuru na ha napụrụ ndị a egbe AK-47 iri na atọ ha sị ha napụrụ ndị uweojii n'ike.

Dịka ndị uweojii sị kọwaa na ndị a bidoro mkpamkpa a kamgbe afọ 2018 ma sị kwa na ha chọpụtara egbe iri na atọ bụ nke ndị uweojii ha siri na ndị a zuru.

Onye na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Onome Onvowakpoyeya gwara BBCIgbo etu ha si ndị a sị ezu ohi.

Ọ kọwara na mmadụ anọ n'ime ndị ha jidere bụ mgbe ha nọ na Keke ka otu onye uweojii bidoro nyowe ha.

Ndị uweojii kwụsịrị Keke ha, ma mgbe enyochara ha ka a chọpụtara mma anọ.

Onvowakpoyeya kwuru na ihe ndị a bu n'obi bụ iwakpo ndị uweojii n'abalị ma zuru egbe ha.

O kwu kwara na ha egbuola ụfọdụ ndị uweojii mgbe ha na-ezupụ ha egbe ha.

Onvowakpoyeya kwukwara na ndị a ha jidere bụ ndị ji ọnụ ha kwuputa na ha bụ ndị otu IPOB.

BBCIgbo gbara mbọ ịnweta Emma Powerful bụ ọnye bụ onyeisi odeakwụkwọ otu IPOB maka mmekọ ọha, kama ekwenti ya agaghị.

Kama ọ depụtara akwụkwọ were si na ndị a ndị uweojii nwụchiri abụghị ndị otu IPOB.

Powerful kwuru na ndị otu IPOB ejighi ọgbaaghara achọ ihe ha na-achọ kama na ha bụ ndị na-achọ udo.

Onye bụ okaiwu ndị otu IPOB bụ Aloy Ejimakor kwukwara na ndị a ndị uweojii nwụchiri abụghị ndị otu IPOB ma sịkwa na IPOB abụghị ndị ọgbaaghara.

Akụkọ ga-amasị gị