Flooding: Idemmiri gburu mmadụ atọ ebe ana achọ mmadụ iri abụọ na abụọ achọ

Ebe foto si, AFP/Getty Images
N'Afrịka, idemmiri sitere na mmiri zoro ụbọchị Satọde egbuola mmadụ atọ ebe ana achọ mmadụ iri na ise achọ na mba Kenya.
Ndị ọrụ gbatagbata nọ n'ọrụ ịchọ ndị niile ya bụ idemmiri buuru.
Ndị obodo ebe ahụ sị na ya bụ mmiri riri ụlọọrụ ndị uweojii, ụlọakwụkwọ nakwa ahịa ha na Pokot County.
Ndị ọrụ Red Cross ebe ahụ sị na ya bụ idemmiri ekweghịzị ndị mmadụ agafe ụzọ nke mere na-ịzọpụta ndị mmadụ ebe ahụ tara akpụ.
Ha kwukwara na-ana achọ ihe ruru mmadụ iri na ise (15) achọ na mpaghara Elgeyo-Marakwet.
Ụlọọrụ redio dị na Elgeyo-Marakwet zipuru ka ọnọdụ dị na mpaghara ahụ n'akara Twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị obodo ebe ahụ na-arịọ gọọmenti ha ka ha wete ụgbọelụ helikọpta ka ndị mmadụ nwee ike ịpụta.
Gee akụkọ ndị ọzọ ebe a
Ndị agha Chad tinyere Boko Haram Oke rie ọnwụọ

Ebe foto si, Getty Images
Ndị Boko Haram iri anọ na anọ ndị agha mba Chad nwuchiri ka ha na-ebuso ha agha anwụọla n'ụlọ mkpọrọ e dowere ha.
Onye ọmaikpe Ukwu nke mba Chad bụ Youssouf Tom sị na nyocha ha mere ozu anọ gosiri na ọ bụ nsi ọnụ ka ejiri gbuo ndị Boko Haram a.
N'okwu o kwuru na TV ụbọchị Satọde, Maazị Youssouf sị ndị nwụrụ so n'ime ndị Boko Haram 58 ndi agha nwuchiri n'ihu agha.
Nyocha emere ndị a gosiri na nsi butere mgbawa obi na nkubi di ha n'ahụ.
Dịka Maazi Tom siri kwuo, "Anyi nwụchịri ndị Boko Haram 58 na Lake Chad kpọrọ ha gawa Ndjamena ịgba ha ajụjụ ọnụ. N'ụtụtụ a ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ ahụ gwara anyi na ha anwụọla."
Ọ sị na ha eliela mmadụ 40 n'ime ndị a nwụrụ.
Otu onye ọrụ nchekwa achọghi ka ekwuo aha ya gwara ụlọ ọrụ ntaakụko AFP na "e tinyere mmadu 58 a n'ime ụlo mkpọrọ ma ghara inye ha ihe ọbụla ruo abali abụọ."
Mahamat Nour Ahmed Ibedou, bu ode akwụkwọ ukwu ngalana akpọrọ "Chadian Convention for the Protection of Human Rights" (CTDDH), bokwara ụdịrị ebubo ahụ.
Ọ sị na agwa "jọgbụrụ onwe ya".
Gọọmentị Chad na-agọ
Minista ikpe na mba ahụ bụ Djimet Arabi gwara AFP na onweghi ajo agwa akapsịrị ndị a aka ji.
Ọ sị; " A hụru nsi n'afọ ha. Ọ bu ha gburu onwe ha, ma ọ bụru ihe ọzọ. Anyị na-achọ ịmata ihe mere."
Ọ sịkwa na ha kpọrọ mmadụ otu onye n'ime ndị Boko Haram a gawa ụlọ ọgwụ, ebe ọ nọ na-agbake.
"Mmadụ iri na atọ fọrọ n'ime ndị a no ọfụma," bụ ihe Arabi kwuru.
A nwụchịrị ndị a na-eche na ha bụ Boko Haram dịka mba Chad busoro ha agha ọkụ ọkụ ka otu ahụ wakporo ma gbuo ndị agha Chad 98 n'ọdọ ndị agha di na Bohama.
Ihe a bu ogbugbu karichaa ndị agha Chad n'otu ubọchị kemgbe ehibere mba ahụ.










