You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Coronavirus Lockdown: Etu ị ga-esi kwado dika a sị ka a nọdụ n'ụlọ
- Onye dere ya, Chioma Obianinwa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Broadcast Journalist, Igbo
Ndị Igbo na-asị na nkwụcha abụghị ụjọ.
Dịka gọọmenti steeti ụfọdụ na Naịjirịa na-akwado ịsị ndị mmadụ nọrọ n'ụlọ maka igbochi mfesa coronavirus, ọ ga-adị mma ka ị mara etu ị ga-esi kwado ka ihe ghara iribido gị na ndị be gị.
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ikuziri ndị mmadụ etu e si ebi ndụ zuruoke bụ Rajiv Sharma kọwara ihe anọ mmadụ ga-eme iji chebiri mgbe a ga-asị onye ọbụla nọrọ n'ụlọ.
1. Jide obi gị aka
Sharma kwuru na ọ dị mma ka ndị mmadụ kwụsị ige maọbụ ikesa akụkọ ụgha gbasara ọrịa coronavirus.
O kwuru na kama ime nke a, tinye uchu n'ime ihe ga-egbochi ya bụ ọrịa ịbata n'ahụ gị site n'iwepụ ụjọ.
Jide obi gị aka.
2. Na-eri mkpuru osisi ọfụma
Sharma dụrụ ọdụ ka ndị mmadụ rie mpkuru osisi dịka oroma, , kiwi, oroma, nkịrịsị, guava, grapefruit, akwụkwọ nri dịka broccoli, cauliflower, Brussel sprouts na capsicums nke gụnyere vitamin C.
O kwuru na ọ dịmma iri nri Alkaline ya karịrị asidi ọrịa ahụ na-ebute. Ụfọdụ nri ndị a gunyere Lemon, Lime, Avocado, Garlic Mango, Tangerine, Pineapple, Dandelion, Oroma nkịrịsị.
3 Na-akwọsi aka ike akwụsị akwụsị
Sharma kwuru ka ndị mmadụ na-akwọ aka ha mgbe ọbụla ghara iji makana asị ka a nọdụ n'ụlọ kwụsị ime nke a.
Were kemikalụ na-egbu nje wee na-agbagasị na bee gị.
Kpuru akwa eji ekpuchi ihu maọbụrụ na ịgaghị ahapụ imetụ aka n'ihu.
4. Kwupute maka onye na-egosi na o bu ọrịa ahụ
Kpesara ndị na-ahụ maka ịchọpụta onye ọrịa coronavirus ji ma ọ bụrụ na onye nọ n'akụkụ gị na-egosi na ha bu ọrịa ahụ.
Ịmaghị ndụ onye inwere ike ịzọ site n'ime nke a.
5. Gokọta ihe ndị ga-abara gị uru
Nwaane gbaa mbọ gote ihe nri ga-anọteturu gị na ndị be gị aka n'oge ahụ ịnọ n'ụlọ.
Gote mmiri ọṅụnụ, ncha na ihe ndị ọzọ eji ehicha ụlọ nakwa ihe nri.
Gote ụmụ ihe egwuregwu ga-enyere ụmụ gị aka izu ike ọfụma.
Ụfọdụ ihe ga-eme maọbụrụ na ịnọ n'ụlọ kwụsị
- Akwụsịla ịkwọ aka gị
- Rie nri zuru oke
- Gbatịa ahụ gị
- Akwụsịkwala inyocha ndị nọ n'akụkụ gị
- A gaghị akwụsị ịgwa ụmụakwụkwọ ka ha ga-esi na-echekwa onwe ha
- Gọọmenti etiti nakwa nke mba ụwa niile kwesiri ịhụ na ha nyochara ọfụma ndị na-abata be ha
Akụkọ ga-amasị gị:
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: