You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Coronavirus: Etu ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ si eche coronavirus aka mgba
Dịka ọrịa coronavirus batarala na Naịjirịa ma na-agbasakwa, ọtụtụ ndị gọvanọ steeti enyela ntuziaka ga-enyere ha igbochi maọbụ ịchịkwa ọrịa ma ọ bata na steeti ha.
Ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ alaghị azụ n'inye ntuziaka nke a dịka ndị ogbo ha nke Legọs, Ekiti, Kwara, Kaduna dgz. siri mee.
N'ụbọchị Fraịde, gọọmenti Abia, Anambra, Enugwu, Ebonyi na Imo Steeti nyere ntuziaka sị ka e mechie ụlọakwụkwọ dum dị na steeti ha.
Ihe ndị ọzọ dị n'akwụkwọ ozi ntuziaka ha nyere gụnyere;
Abịa Steeti
Gọọmenti Abia Steeti nke gọvanọ Okezie Ikpeazu nọ n'isi ya nyere ntuziaka ndị gụnyere nke a:
- Imachi agbamakwụkwọ, akwamozu na ọgbakọ ọbụla karịrị mmadụ 30 ruo izuụka anọ.
- Mmadụ 30 ahụ agaghị anọkọrịta onwe ha nso.
- Imechi ụlọakwụkwọ niile n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Eprelụ.
- Ha nyekwara iwu sị na tupu nke a ahụ eme ka ụlọakwụkwọ niile tinye ihe e ji akwọ aka n'ụlọakwụkwọ ha.
- Ha amawapụtala ebe abụọ a ga-elekọta ndị butere ọrịa a maọbụ ndị a na-enyo na ha ebutela ya, ebe ndị a gụnyere; ụlọọgwụ 'Federal Medical Centre (FMC) na Amachara Specialist Hospital' dị n'Ụmụahụa.
Anambara Steeti
Dịka kọmịshọna mgbasaozi n'Anambra Steeti bụ Don Adinuba si kọọwa na gọọmenti gọvanọ Willie Obiano ewepụtala atụmatụ ndị gụnyere;
- Inye iwu ka ndị ọrụ oyibo ga zuo ike n'ụlọ izuụka abụọ bido taa bụ Tuzde Maachị 24.
- Mmechi ụlọakwụkwọ Praimarị na Sekọndịrị malite n'ụbọchị 30 ọnwa Maachị.
- Mmechi nke ụlọakwụkwọ dị elu (Mahadum) ga-amalite n'ụbọchị 23 Maachị.
- Mmachị ọgbakọ dịka agbamaakwụkwọ, akwamozu, ichi echiche na nzukọ ọbụla karịrị mmadụ iri na atọ malite na Maachị 23.
- Ha wepụtara akara ekwentị ndị a ga-akpọ ma ọ gbajuọ dọrọ nke gụnyere; 08030953771, 08145434416, 08117567363, 08058967320.
Enugwu Steeti
Gọvanọ Enugwu Steeti bụ Ifeanyi Ugwuanyị gbakwara mbọ nke ya ịhụ na Steeti ya keere nkwụcha na mgbochị ọrịa a site n'ụzọ ndị a;
- Inye iwu ka ndị ọrụ nọrọ n'ụlọ na-arụ ọrụ.
- Imachi mmemme omenala na mmemme ndị ọzọ dịka agbamakwụkwọ, akwamozu na ndị ọzọ.
- Mmechi Praimarị na Sekọndịrị ga-amalite n'ụbọchị Maachị 30
- Mmapụta nde naira 330 maka ibuso ọrịa coronavirus agha nakwa ihiwe ebe ọhụrụ a ga-enyocha ndị mmadụ ahụ n'ụlọọgwụ Parklane, Enugwu
- Ọ dị na mkpa kpọọ akara ekwentị ndị a; 117, 112 maọbụ 08182555550 maka gbata gbata
Ebonyi Steeti
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Ụmahi nọọrọ n'ozi nke Ugbala Kenneth Igwe binyere aka nye ntuziaka ndị a;
- Mmechi ụlọakwụkwọ praịmarị, sekọndịrị nakwa mahadum bido na Maachị 20.
- Ka ahịa na ụlọụka niile dị na steeti ahụ gbaa mbọ tinye mmanụ mgbochi nkesa nje a kpọrọ hand sanitizer na bekee.
- Ka ndị ọrụ ahụike gawa n'ụlọ n'ụlọ na-enyocha ekpomọkụ ahụ ndị bi na steeti Ebonyi.
- Ka onye ọbụla kwụsị ikwe mmadụ n'aka maọbụ ịmakọ mmadụ.
Imo Steeti
Gọvanọ Hope Uzodinma gbasara ozi pụrụiche n'ụbọchị Fraide banyere ọrịa coronavirus bụ ebe o mere ihe ndị gụnyere;
- Nhiwe kọmịtị mmadụ itoolu maka Covid-19
- Nhibe 'isolation centre na Owere
- Mgbasaozi maka etu aga esi gbochie nkesa ọrịa
- Ụgbọ 'ambulance' maka ịza oku gbata gbata
Mụta etu e si akwọ aka ọfụma maka mgbochị ọrịa