You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gọvanọ Okezie Ikpeazu akpọghị IPOB otu oyiegwu- Abia State
Gọọmentị Abia steeti ekwuola na akụkọ na-efegharị nke sị na gọvanọ Abia steeti bụ Okezie Ikpeazu kwuru na ya achọghị ndị oyi egwu bụ Ipob na steeti ya bụ asi.
Ọnụ na ekwuchitere gọọmentị Abia steeti bụ Onyebuchi Ememanka kwuru na ọnweghị mgbe Ikpeazu jiri kwuo ụdịrị okwu a ma ọ bụ na nzụzọ ma n'ịhu ọha mmadụ.
O kwuru sị na dịka ọnụ na ekwuchitere Abia steeti ma sị na enweghị mgbe Gọvanọ Abia steeti jiri kwuo ụdịri okwu a.
Ememanka kwuru na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ajụrụ ajụ oge emere ntụlịaka bidoro akụkọ ụgha a.
O kọwakwara na ndị ndọrọndọrọ ọchịchi a bị na Legos steeti ma sị kwa na ụche obi ha bụ ibute ọgbaaghara na Abia steeti.
Na Benue Steeti
Ọnụ na-ekwuchitere gọọmentị Benue bụ Shehu Tambaya akpọkuola gọọmetị etiti ka ha hapu ịkpọlata ndị agha na-echekwa ebe dị iche iche na Naijirịa.
Tambara kwuru nke a ma sị ọkachasị Benue steeti ebe ndi mmadụ bi na ogige gbata gbata maka nwakpo ndị ọchi ehi na awakpo ha n'ime obodo.
N'Ofesi
Ndị oyi egwu bụ Al shabaab awakpoola ọgịge ndị agha Kenya na nke mba Amerịka dị na Obodo Lamu na Kenya.
Ha mebiri otutu ụgbọelu na ụgbọala tupu ndị agha mba Kenya were chụpụ ya.
N'egwuregwu
Na FA Cup taa; Ndị otu egwu bọọlu Chelsea achịrila aja nwunye ndị Nottingham forest n'ọnụ dịka ha jị ọkpụ goolu xxx asataghị ma ncha were merie ha na asọmpị FA cup ebe Liverpool ji otu ọkpụ goolu were kpaa ndị otu Everton Eze.